Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 38:18 - Bible Nso

18 ma ọ buru na i pukughi ndi-isi eze Babilon, agēnye kwa obodo a n'aka ndi Kaldea, ha gēsure kwa ya n'ọku, gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n'aka-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nyefee nʼaka ndịisi eze Babilọn, a ga-enyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn. Ha ga-akpọkwa ya ọkụ, ma gị onwe gị agakwaghị agbapụ site nʼaka ha.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 38:18
20 Iomraidhean Croise  

Jehoiakin, bú eze Juda, we pukuru eze Babilon, ya onwe-ya, na nne-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-onozi-ya: eze Babilon we jide ya n'arọ nke-asatọ nke ọ bu eze.


N'ihi na edowom irum n'aru obodo a ime ya ihe ọjọ, ọ bughi ime ya ezi ihe, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'aka eze Babilon ka agēnye ya, ọ gēsure kwa ya n'ọku.


O gēru kwa, na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè onye ahu, bú Nebukadneza eze Babilon, nke nāgaghi-etiye kwa olu-ya na yoke nke eze Babilon, M'gēji mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ajọ ọria nēfe efe, leta mba ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), rue mb͕e M'mere ka ha gwusia site n'aka-ya.


Ndi Kaldea gābiaghachi kwa, buso obodo a agha; ha gēwere kwa ya, sure ya n'ọku.


Ọ bu kwa ndinyom-i nile na umu-gi ka ha ganēme ka ha pukuru ndi Kaldea: gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n'aka-ha, kama aka eze Babilon gējide gi: ọ bu kwa obodo a ka i gēsure n'ọku.


Otú a ka Jehova siri, Aghaghi inye obodo a n'aka usu-ndi-agha nke eze Babilon, ọ gēwere kwa ya.


na ndi-isi nile nke eze Babilon batara, we nọdu n'ọnu-uzọ-ama nke etiti, bú Neagal-shareza, na Samga-nebo, na Sasekim, bú Rab-saris, na Neagal-shareza, bú Rab-mag, na ndi-isi nile nke eze Babilon fọduru.


Ọ bu kwa ulo eze na ulo nile nke ndi Israel ka ndi Kaldea surere n'ọku, ha kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem.


M'gāb͕asa kwa ub͕um n'aru ya, agāma kwa ya n'ọnyàm: M'gēme kwa ka ọ biarue Babilon, bú ala ndi Kaldea; ma ala ahu ka ọ nāgaghi-ahu, ma n'ebe ahu ka ọ gānwu.


O we nupu isi n'okpuru ya n'iziga ndi-ozi-ya n'Ijipt ka ha we nye ya inyinya na ndi bara uba. Ọ̀ gāgara ya nke-ọma? ọ̀ gēwepuga onwe-ya, bú onye nēme ihe ndia? ọ̀ gēmebi ọb͕ub͕a-ndu, we wepuga onwe-ya?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan