Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 37:5 - Bible Nso

5 Ọzọ, usu-ndi-agha Fero esiwo n'Ijipt puta: ndi Kaldea ndi nānọchigide Jerusalem n'agha we nuru akukọ-ha, ha we si n'imegide Jerusalem rigo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Nʼihi na mgbe ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu na-ebuso ya agha, ndị agha Fero sitere Ijipt na-apụkwute ha ibuso ha agha. Mgbe ndị agha Babilọn nụrụ na ndị agha Ijipt na-abịa, ha mere ngwangwa si nʼibuso Jerusalem agha wezuga onwe ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 37:5
7 Iomraidhean Croise  

Ma eze Ijipt esighi n'ala-ya puta ọzọ ma-ọli: n'ihi na eze Babilon ewerewo ihe nile eze Ijipt nwere site na miri-iyi Ijipt rue osimiri Yufretis.


Ọ bu kwa Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-isi-ya ka M'gēnye n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha, na n'aka usu-ndi-agha nke eze Babilon, ndi nēsi n'ebe unu nọ rigo la.


O rue, mb͕e usu-ndi-agha nke ndi Kaldea siri n'imegide Jerusalem rigo n'ihi usu-ndi-agha Fero,


Okwu Jehova we rue Jeremaia, bú onye-amuma, nti, si,


Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Otú a ka unu gāsi eze Juda, onye zìworo unu biakutem ijum ase; Le, usu-ndi-agha Fero, nke putaworo iyere unu aka, gālaghachi n'ala-ya, bú Ijipt.


O we nupu isi n'okpuru ya n'iziga ndi-ozi-ya n'Ijipt ka ha we nye ya inyinya na ndi bara uba. Ọ̀ gāgara ya nke-ọma? ọ̀ gēwepuga onwe-ya, bú onye nēme ihe ndia? ọ̀ gēmebi ọb͕ub͕a-ndu, we wepuga onwe-ya?


Fero agaghi-achiri kwa oké usu-ndi-agha-ya na nkpọkọta-madu-ya bara uba me ya ihe ọ bula n'agha ahu, mb͕e ha gāwukọta obo-ihe, wue ulo-agha, ibipu ọtutu madu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan