Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 37:2 - Bible Nso

2 Ma ọ geghi nti, ya onwe-ya, ma ndi-orù-ya, ma ndi ala ahu, n'okwu nile nke Jehova, nke O kwuru site n'aka Jeremaia, bú onye-amuma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ma Zedekaya na ndị ozi ya, na ndị Juda niile egeghị ntị nʼokwu Onyenwe anyị nke o si nʼọnụ Jeremaya onye amụma gwa ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 37:2
15 Iomraidhean Croise  

Devid we si, M'gēmere Hanun nwa Nehash ebere, dika nna-ya merem ebere. Devid we ziga ikasi ya obi bayere nna-ya site n'aka ndi-orú-ya. Ndi-orù Devid we ba n'ala umu Amon.


O we zìe site n'aka Netan, bú onye-amuma, kpọ aha-ya Jedidaia, n'ihi Jehova.


Israel nile we lìe ya, tiere ya aka n'obi; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka orù-Ya, bú Ahaija onye-amuma.


Ọzọ kwa, n'aka Jihu, bú nwa Hanani, onye-amuma, ka okwu Jehova biara imegide Beasha, na imegide ulo-ya, ma n'ihi ihe ọjọ nile nke o mere n'anya Jehova, iwere omume aka-ya kpasue Ya iwe, n'idi ka ulo Jeroboam; ma n'ihi na o tib͕uru ya.


Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem:


Ma ọ siri, Biko, Onye-nwe-ayi, biko, zìe n'aka onye I gēziga.


Onye nēbipu ukwu onwe-ya na onye nāṅu ime-ihe-ike dika miri Ka onye ahu bu nēzi ozi site n'aka onye-nzuzu.


Ọ buru na onye nāchi achi aṅa nti okwu-ugha, Ndi nile nējere ya ozi bu ndi nēmebi iwu.


Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Je, gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu, si ya, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje inye obodo a n'aka eze Babilon, ọ gēsure kwa ya n'ọku:


Ma gi onwe-gi, onye emeruworo aru, onye nēmebi iwu, bú onye-isi Israel, onye ubọchi-ya biaworo, na mb͕e ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu;


Agwawokwam ndi-amumam okwu, ọ bu kwa Mu onwem mere ka ọhù ba uba; ọ bu kwa site n'aka ndi-amuma ka M'ji ihe ama àtù.


Eron na umu-ya ndikom we me ihe nile Jehova nyere n'iwu site n'aka Moses.


Ya mere onye nāju, ọ bughi madu ka ọ nāju, kama ọ bu Chineke, Onye nēnye Mọ Nsọ Ya ka Ọ ba nime unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan