Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 36:9 - Bible Nso

9 O rue, n'arọ nke-ise nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, n'ọnwa nke-iteghete, na ndi nile ndi nọ na Jerusalem, na ndi nile ndi si n'obodo nile nke Juda abata na Jerusalem, kpọsara obubu-ọnu n'iru Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Nʼọnwa itoolu nke afọ ise nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda, e doro oge dị iche nye maka ibu ọnụ nʼihu Onyenwe anyị. E kwusara ibu ọnụ a nye ndị niile nọ na Jerusalem, na ndị si nʼobodo Juda niile bịa na Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 36:9
16 Iomraidhean Croise  

Jehoshafat we tua egwu, che iru-ya ichọ Jehova; o we kpọsa obubu-ọnu na Juda nile.


Ma n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nka achikọtara umu Israel n'obubu-ọnu, na n'ákwà-nke, ájá dikwasi kwa ha.


Je, chikọta ndi-Ju nile ndi aganāchọta nime Shushan, nēbu-kwa-ranum ọnu, unu eri-kwa-la ihe, aṅu-kwa-la ihe-ọṅuṅu ubọchi atọ, abali na ehihie: mu onwem na umu-ab͕ọghọm gēbu kwa ọnu otú a; ma n'uzọ di otú a ka m'gābakuru eze, nke nādighi ka iwu si di: ma asi na alawom n'iyì, alawom n'iyì.


O rue, n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, na okwu a ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,


Ma eze nānọdu n'ulo mb͕e oyi n'ọnwa nke-iteghete: ọku nēnwu kwa n'ite-ọku nke di n'iru ya.


ma gi onwe-gi je, gua n'akwukwọ-npiakọta ahu, nke i deworo site n'ọnum, okwu nile nke Jehova na nti ndi Israel, n'ulo Jehova n'ubọchi obubu-ọnu: ọ bu kwa na nti Juda nile ndi si n'obodo nile ha abia ka i gāgu ha.


Kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, ti-kwa-nu aka n'obi, unu ndi-nchu-àjà; kwasienu ákwá ike, unu ndi-oje-ozi nke ebe-ichu-àjà; bianu, nọ ọnọdu-abali n'ákwà-nkpe, unu ndi nējere Chinekem ozi: n'ihi na eb͕ochiwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Chineke-unu.


Donu obubu-ọnu nsọ, Kpọnu ubọchi nb͕ochi, chikọtanu ndi-okenye na ndi nile bi n'ala n'ulo Jehova, bú Chineke-unu, tiku-kwa-nu Jehova.


Otú ọ di, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa nka ka ubọchi nkpuchi-nmehie gādi: nkpọkọta nsọ ka ọ gāburu unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala; unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova.


Ndi Nineve we kwere na Chineke; ha we kpọsa obubu-ọnu, yiri ákwà-nkpe, site n'onye uku ha we rue onye ntà ha.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Obubu-ọnu nke ọnwa nke-anọ, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-ise, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-asa, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-iri, gāghọrọ ulo Juda obi-utọ na ọṅù, na mb͕e akara àkà di nma; hu-kwa-nu ezi-okwu na udo n'anya.


Umu Israel nile, na ndi ahu nile, we rigo, biarue Bet-el, kwa ákwá, nọdu n'ebe ahu n'iru Jehova, bue ọnu n'ubọchi ahu rue anyasi; ha we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Jehova.


Ha we chikọta onwe-ha rue Mizpa, sere miri, wusi ya n'iru Jehova, bue ọnu n'ubọchi ahu, kwue n'ebe ahu, si, Ayi emehiewo megide Jehova. Samuel we kpe umu Israel ikpe na Mizpa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan