Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 36:6 - Bible Nso

6 ma gi onwe-gi je, gua n'akwukwọ-npiakọta ahu, nke i deworo site n'ọnum, okwu nile nke Jehova na nti ndi Israel, n'ulo Jehova n'ubọchi obubu-ọnu: ọ bu kwa na nti Juda nile ndi si n'obodo nile ha abia ka i gāgu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Nʼihi ya, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼụbọchị ibu ọnụ, nọdụ nʼebe ahụ gụpụtara ndị mmadụ okwu Onyenwe anyị ndị a ị dere nʼakwụkwọ dịka m kpọpụtara ha. Gụpụtara ya ndị Juda si obodo niile bịa nʼụlọnsọ ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 36:6
13 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, biko, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu onwem nākpu ihe ọjọ megide unu, nēchè kwa èchìchè megide unu: biko, sinu, onye ọ bula n'uzọ ọjọ ya, lata, me kwa ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma.


Jeremaia we si na Tofet bia, ebe Jehova zigara ya ibu amuma; o we guzo n'ogige ulo Jehova, si ndi Israel nile:


si, Nuru okwu Jehova, gi eze Juda, onye nānọkwasi n'oche-eze Devid, gi onwe-gi, na ndi-orù-gi, na ndi-gi ndi nābata n'ọnu-uzọ-ama ndia.


Otú a ka Jehova siri: Guzo n'ogige ulo Jehova, gwa obodo nile nke Juda, bú ndi nābia ikpọ isi ala n'ulo Jehova, okwu nile nke M'nyere gi n'iwu igwa ha; agubìla otù nime ha.


Were n'onwe-gi akwukwọ-npiakọta, de nime ya okwu nile nke M'gwaworo gi imegide Israel, na imegide Juda, na imegide mba nile, site n'ubọchi M'gwara gi okwu, site n'ubọchi Josaia, we rue ta.


Jeremaia we kpọ Beruk nwa Neraia; Beruk we dere n'ọnu Jeremaia okwu nile nke Jehova, nke Ọ gwara ya-ri, n'akwukwọ-npiakọta.


Guzo n'ọnu-uzọ-ama ulo Jehova, we kpọsa okwu a n'ebe ahu, si, Nurunu okwu Jehova, unu Juda nile, ndi nābà n'ọnu-uzọ-ama ndia ikpọ isi ala nye Jehova.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Obubu-ọnu nke ọnwa nke-anọ, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-ise, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-asa, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-iri, gāghọrọ ulo Juda obi-utọ na ọṅù, na mb͕e akara àkà di nma; hu-kwa-nu ezi-okwu na udo n'anya.


Ma mb͕e o ruru ọtutu oge, mb͕e ije-ub͕ọ di kwa egwu ub͕u a, n'ihi na ub͕u a ka oge Obubu-ọnu gasiri, Pọl we dọ ha aka na nti,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan