Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 36:5 - Bible Nso

5 Jeremaia we nye Beruk iwu, si, Mu onwem bu onye eb͕ochibidoworo; apughm ibà n'ulo Jehova:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Emesịa, Jeremaya gwara Baruk okwu sị ya, “Ọnọdụ nke m nọ nʼime ya ugbu a agaghị ekwe ka m site nʼebe a pụọ jeruo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 36:5
15 Iomraidhean Croise  

Ma mu onwem batara n'ulo Shemaia nwa Delaia nwa Mehetabel, ma emechidoworo onye ahu uzọ; o we si, Ka ayi zukọta n'ulo Chineke, n'etiti ulo uku Chineke, ka ayi mechi kwa uzọ nile nke ulo uku Chineke: n'ihi na ha nābia ib͕u gi; e, n'abali ka ha nābia ib͕u gi.


I mewo ka ndi m'mara nke-ọma nọm n'ebe di anya; I mewom ka m'ghọrọ ha ihe-árú: Abum onye eb͕ochiworo, adighm-apu kwa n'èzí.


Pashua we tie Jeremaia, bú onye-amuma, ihe, tiye ya n'ọtọsi ahu nke di n'ọnu-uzọ-ama Benjamin di n'elu, nke di n'ulo Jehova.


m'we were akwukwọ nzuta-ala ahu nye Beruk nwa Neraia, nwa Mahseia, n'anya Hanamel nwa nwa-nne nnam, na n'anya ndi-àmà ndi deworo aha-ha n'akwukwọ nzuta-ala ahu, n'anya ndi-Ju nile ndi nānọdu ala n'ogige ulo-nche ahu.


Ma mb͕e ahu usu-ndi-agha eze Babilon nānọchigide Jerusalem n'agha: ma Jeremaia, bú onye-amuma, nọ ka onye eb͕ochibidoworo n'ogige ulo-nche, nke di n'ulo eze Juda.


Okwu Jehova we rue Jeremaia nti nke ub͕ò abua, mb͕e ya onwe-ya nọ ka onye eb͕ochibidoworo n'ogige ulo-nche, si,


Ndi-isi we wesa Jeremaia iwe, tie ya ihe, tiye ya n'ulo-nkpọrọ, bú ulo Jonatan ode-akwukwọ; n'ihi na ulo ahu ka ha mereri ulo-nkpọrọ.


Jeremaia we nọgide n'ogige ulo-nche rue ubọchi ewere Jerusalem. O rue, mb͕e ewere Jerusalem,


Ha we were Jeremaia, tubà ya n'olùlù Malkija nwa eze, nke di n'ogige ulo-nche: ha we chiri udọ̀ rada Jeremaia. Ma miri adighi n'olùlù ahu, ọ bu nání apiti: Jeremaia we mibe n'apiti ahu.


Ma ub͕u a, le, atọpuwom i ta na nkpọrọ nke di n'aka-gi. Ọ buru na ọ di nma a'anya-gi isorom bia na Babilon, bia, anyam gādi kwa a'aru gi; ma ọ buru na ọ jọrọ njọ n'anya-gi isorom bia na Babilon, ghara: le, ala nka nile di n'iru gi; n'ebe di nma na n'ebe ziri ezi n'anya-gi ije, je n'ebe ahu.


Hà bu ndi nējere Kraist ozi? (anamekwu dika onye anya nādighi nma) mu onwem nēje kari; anamadọb͕ubiga onwem ókè n'ọlu kari, anamanọbiga ókè n'ulo-nkpọrọ kari, anāpiam utari nke-uku ri nne, anọm n'ọnu ọnwu ọtutu mb͕e.


N'ihi nka mu onwem Pọl, onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus n'ihi unu ndi mba ọzọ,


nke m'bu ukọ̀ nime nkpọrọ n'ihi ya; ka m'we kwuwa okwu nime ya, dika m'nāghaghi ikwu.


nke m'nāhuju anya nime ya rue ab͕u, dika onye nālu ọlu ọjọ; ma ekeghi okwu Chineke ab͕u.


ma ndi ọzọ ka anwara ọnwunwa nke ihe-ọchi na utari, e, tukwasi ihe ndia, nke ab͕u na ulo-nkpọrọ:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan