Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 36:32 - Bible Nso

32 Ma Jeremaia were akwukwọ-npiakọta ọzọ nye Beruk nwa Neraia, bú ode-akwukwọ; o we dere n'ọnu Jeremaia n'elu ya okwu nile nke akwukwọ ahu nke Jehoiakim, bú eze Juda, surereri n'ọku; ọzọ kwa, atukwasiri n'elu ha ọtutu okwu dika ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Ya mere, Jeremaya weere akwụkwọ ọzọ nye Baruk ode akwụkwọ, bụ nwa Neraya, dịka Jeremaya na-akpọpụta okwu, Baruk depụtakwara nʼakwụkwọ okwu ndị ahụ niile, nke Jehoiakim eze Juda surere nʼọkụ. A tụkwasịkwara nʼelu ha ọtụtụ okwu ndị ọzọ nke dịka ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 36:32
13 Iomraidhean Croise  

Jehova we si Moses, Wara onwe-gi mbadamba nkume abua dika nke-mbu: M'gēdekwasi kwa na mbadamba nkume ahu okwu nile nke di n'elu mbadamba nkume mbu, nke i tupiara.


Beruk we si ha, N'ọnu-ya ka ọ nākpọrọm okwu ndia nile, ma mu onwem were ink ede ha n'akwukwọ a.


O rue, mb͕e Jehudi gusiri ibe akwukwọ atọ ma-ọbu anọ, na o ji mma ode-akwukwọ bìkasia ya, tubà ya n'ọku nke di n'ite-ọku, rue mb͕e akwukwọ-npiakọta ahu resiri n'ọku nke di n'ite-ọku.


Jeremaia we kpọ Beruk nwa Neraia; Beruk we dere n'ọnu Jeremaia okwu nile nke Jehova, nke Ọ gwara ya-ri, n'akwukwọ-npiakọta.


Mb͕e ahu Nebukadneza juputara n'ọnuma, udi iru-ya we b͕anwe imegide Shedrak na Mishak na Abed-nego: ya mere ọ zara, si ka ha me oké ọku ahu ka ọ di ọku ub͕ò asa kari otú anēmeri ka ọ di ọku.


N'arọ mbu nke Belshaza, bú eze Babilon, Daniel huru nrọ na ọhù di iche iche nke isi-ya n'elu ihe-ndina-ya: mb͕e ahu nrọ ahu ka o dere n'akwukwọ, ọ bu isi ihe n'ihe nile ọ huru ka o kwuru.


Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti rue ihe ndia, M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa ọzọ n'ihi nmehie nile unu.


Ma ọ buru na unu ejeghari n'imegidem, we ghara ikwe igem nti; M'gātukwasi kwa unu ihe-otiti ub͕ò asa ọzọ dika nmehie-unu nile si di.


Mu onwem gējeghari kwa n'imegide unu; M'gēti kwa unu ihe ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu.


M'gējeghari kwa n'imegide unu n'ọnuma; M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu.


Mu onwem, bú Tatiọs, onye nēde akwukwọ-ozi a, nēkele unu nime Onye-nwe-ayi.


Mu onwem nāb͕ara onye ọ bula àmà, bú onye nānu okwu nile nke amuma nke akwukwọ a, si, Ọ buru na onye ọ bula gātukwasiri ha okwu, Chineke gātukwasiri ya ihe-otiti nile nke edeworo n'akwukwọ a:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan