Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 36:31 - Bible Nso

31 M'gēji kwa ajọ omume-ha leta ya, leta kwa nkpuru-ya, leta kwa ndi-orù-ya; M'gēme kwa ka ihe ọjọ ahu nile nke M'gwara ha, ma ha anughi, biakwasi ha, biakwasi kwa ndi bi na Jerusalem, biakwasi kwa ndi Juda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Aga m ata ya na ụmụ ya, na ndị ozi ya ahụhụ nʼihi ajọ omume ha. Aga m eme ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru ihe banyere ya bịakwasị ha na ndị niile bi na Jerusalem, na ndị Juda niile, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 36:31
16 Iomraidhean Croise  

O mewo kwa ka ajọ ihe-ha laghachikute ha, Ọ bu kwa ihe ọjọ ha ka Ọ gēji kpochapu ha; Jehova, bú Chineke-ayi, gēkpochapu ha.


Onye anābara nba ọtutu mb͕e ma ọ nēkwesi olu-ya ike, N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.


Ma ha egeghi nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala, ha we jegharia, onye ọ bula n'isi-ike nke obi ọjọ ha: M'we me ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a biakwasi ha, bú nke M'nyere n'iwu ka ha me, ma ha emeghi ha.


Ka ihere me ndi nēsob͕um, ma ka ihere ghara ime mu onwem; ka ndi ahu tua ujọ, ma ka mu onwem ghara itu ujọ: me ka ubọchi ihe ọjọ biakwasi ha, were kwa okpukpu ntipia abua tipia ha.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ a nile biakwasi obodo a, biakwasi kwa obodo-ya nile, bú nke M'kwuworo megide ya; n'ihi na ha ekwesiwo olu-ha ike, ka ha ghara inu okwum nile.


Ma onye-amuma ahu, ma-ọbu onye-nchu-àjà ahu, ma-ọbu ndi ahu, nke gāsi, Le, ibu Jehova nēbo: M'gēwere kwa nmehie-ya leta nwoke ahu, leta kwa ulo-ya.


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iji nmehie Shemaia onye-Nehelamait leta ya, leta kwa nkpuru-ya; ọ gaghi-enwe nwoke ọ bula nēbi n'etiti ndi nka, ọ gaghi-elekwasi kwa ezi ihe ahu anya, bú nke Mu onwem nēmere ndim, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na okwu nwezuga ka o kwuworo megide Jehova.


n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ ahu nile biakute Juda, biakute kwa ndi nile bi na Jerusalem, bú nke M'kwuworo megide ha: n'ihi na agwawom ha okwu, ma ha anughi; M'we kpọ ha òkù, ma ha azaghi.


O mee ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Jehoiakim mere.


Ub͕u a na nwa mb͕e ntà ka M'gāwukwasi gi ọnumam, mezu kwa iwem imegide gi, kpe gi ikpe dika uzọ-gi nile si di; M'gētiyekwasi kwa gi ihe-árú-gi nile.


Anyam agaghi-enwe kwa ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko: dika uzọ-gi nile si di ka M'gētiyekwasi gi ihe, ihe-árú-gi nile gādi kwa n'etiti gi; unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, nētib͕u.


Ma ọ buru na unu egeghm nti, unu ewe ghara ime ihe nile ndia M'nyere n'iwu;


Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nneku-ọkuku nāchikọ umu-ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi!


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan