Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 36:24 - Bible Nso

24 Ma ha atughi oké egwu, ha adọwaghi kwa uwe-ha, bú eze na ndi-orù-ya nile ndi nānu okwu ndia nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Eze na ndị so ya nọdụ nʼoge a na-agụpụta akwụkwọ a atụghị egwu ọbụla; ha adọwakwaghị uwe ha igosi obi ọjọọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 36:24
20 Iomraidhean Croise  

Reuben we biaghachi n'olùlù ahu; ma, le, Josef anọghi n'olùlù ahu; ọ we dọwa uwe-ya nile.


Jekob we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, yiri ákwà-nkpe n'úkwù-ya, ruru nwa-ya újú ọtutu ubọchi.


Devid we jide uwe-ya, dọwa ha; otú a ka ndikom nile ya na ha nọ me-kwa-ra.


O rue, mb͕e Ehab nuru okwu ndia, na ọ dọwara uwe-ya nile, tukwasi ákwà-nkpe n'anu-aru-ya, bue ọnu, dina n'ákwà-nkpe, jegharia nwayọ.


E, gi onwe-gi nēmebi egwu, Nēbilata kwa ntughari-uche n'iru Chineke.


Ihe nke nāputa n'ọnu njehie nke onye nēmebi iwu nāsi n'etiti obim Ọ dighi oké egwu Chineke di n'anya-ya abua.


N'ihi na ọ nāgwa onwe-ya okwu ire-utọ n'anya onwe-ya, Bayere ichọputa ajọ omume-ya na ikpọ ya asì.


Ha nēme okwu ọjọ ka ọ diri ha ike; Ha nākọ akukọ bayere isi ọnyà na nzuzo; Ha siri, Ònye gāhu ha?


Fero we chigharia, ba n'ulo-ya, ma o tiyeghi obi-ya ọbuná na nka.


Jehova, ebuliwo aka-Gi, ma ha adighi-ahu: ha gāhu ekworo I nēkworo ndi-Gi, ihere ewe me ha; ọzọ, ọku nke ndi nēmegide Gi gērichapu ha.


Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we biakute Hezekaia, ha na uwe-ha dọwara adọwa, ha we gosi ya okwu nile nke Rabshake.


O rue, mb͕e eze, bú Hezekaia, nuru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, were ákwà-nkpe kpuchie onwe-ya, ba n'ulo Jehova.


O rue, mb͕e ha nusiri okwu ndia nile, na ha turu oké egwu, onye na ibe-ya, ha we si Beruk, Ayi aghaghi igosi eze okwu ndia nile.


Jehova, ànya-Gi abua adighi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di? I tiwo ha ihe, ma o wutaghi ha; I mewo ka ha gwusia, ma ha ajuwo inara idọ-aka-na-nti: ha emewo ka iru-ha di ike nkume; ha ajuwo ilata.


Okwu ahu we rute eze Nineve aru, ọ we si n'oche-eze-ya bilie, yipu uwe-nwuda-ya n'aru ya, kpuchie onwe-ya n'ákwà-nkpe, nọkwasi na ntu.


Ndikom Nineve gēso ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n'ihi na ha chèghariri na nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n'ebe a.


Egwù Chineke adighi n'anya-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan