Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 36:14 - Bible Nso

14 Ndi-isi nile we zìe Jehudi nwa Netanaia, nwa Shelemaia, nwa Kushi, jekuru Beruk, si, Akwukwọ-npiakọta ahu nke iguworo ihe nime ya na nti ndi Israel, were n'aka-gi bia. Beruk nwa Neraia we were akwukwọ-npiakọta ahu n'aka-ya, biakute ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 ndịisi ahụ niile zipụrụ Jehudi nwa Netanaya, nwa Shelemaya, nwa Kushi, ka o jekwuru Baruk sị ya “Were akwụkwọ ahụ ị si na ya gụpụtara ndị mmadụ ihe, bịa.” Ya mere, Baruk, nwa Neraya, ji akwụkwọ a nʼaka ya jekwuru ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 36:14
12 Iomraidhean Croise  

Ndi-isi nile nke usu-ndi-agha nile, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia onye-nlekọta, ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan nwa Karca, na Seraia nwa Tanhumet onye Netofa, na Jaazanaia nwa onye Meakat, ha onwe-ha na ndikom-ha.


Were n'onwe-gi akwukwọ-npiakọta, de nime ya okwu nile nke M'gwaworo gi imegide Israel, na imegide Juda, na imegide mba nile, site n'ubọchi M'gwara gi okwu, site n'ubọchi Josaia, we rue ta.


Eze we ziga Jehudi iweta akwukwọ-npiakọta ahu: o we weputa ya n'ime-ulo Elishama, bú ode-akwukwọ. Jehudi we gua ya na nti abua nke eze, na na nti ndi-isi nile ndi nēguzo n'akuku eze.


Jeremaia we kpọ Beruk nwa Neraia; Beruk we dere n'ọnu Jeremaia okwu nile nke Jehova, nke Ọ gwara ya-ri, n'akwukwọ-npiakọta.


ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan na Jonatan, bú umu Karea, na Seraia nwa Tanhumet, na umu Efai, bú onye Netofa, Jezanaia nwa onye Meaka, ha onwe-ha na ndikom-ha.


Johanan nwa Karea na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya we chiri ndi Israel nile fọduru, bú ndi o mere ka ha si n'aka Ishmael nwa Netanaia lata, site na Mizpa, mb͕e o tib͕usiri Gedalaia nwa Ahaikam, bú ndikom, ndi bu ndi-agha, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ndi-onozi, ndi o mere ka ha si na Gibeon lata:


n'ihi ndi Kaldea: n'ihi na ha turu egwu ha, n'ihi na Ishmael nwa Netanaia etib͕uwo Gedalaia nwa Ahaikam, onye eze Babilon mere onye-nlekọta ala-ha.


Okwu Jehova nke ruru Zefanaia nwa Kushi, nwa Gedalaia, nwa Amaraia, nwa Hezekaia, nti, n'ubọchi Josaia nwa Emon, bú eze Juda.


Le, Mu onwem nēzipu unu dika aturu n'etiti agu: ya mere, burunu ndi nwere uche dika agwọ, ndi nādighi kwa aghughọ dika nduru.


Unu atu-kwa-la egwu ndi nēb͕u aru, ma ha apughi ib͕u nkpuru-obi: kama nātunu egwu Onye ahu Nke puru ila nkpuru-obi na aru n'iyì n'ọku ala-mọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan