Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 36:12 - Bible Nso

12 o we rida n'ulo eze, rue ime-ulo nke ode-akwukwọ: ma, le, n'ebe ahu ka ndi-isi nile nānọdu, bú Elishama ode-akwukwọ, na Delaia nwa Shemaia, na Elnetan nwa Akboa, na Gemaraia nwa Shefan, na Zedekaia nwa Hananaia, na ndi-isi nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 o si nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ ode akwụkwọ dị nʼụlọeze, ebe ndịisi niile zukọrọ. Ndị a bụ ndị zukọrọ nʼebe ahụ; Elishama, ode akwụkwọ, na Delaya nwa Shemaya, na Elnatan nwa Akboa, na Gemaraya nwa Shefan, na Zedekaya nwa Hananaya, na ndịisi ọchịchị ndị ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 36:12
13 Iomraidhean Croise  

Eze we nye Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam nwa Shefan, na Akboa nwa Maikaia, na Shefan, bú ode-akwukwọ, na Asaia, bú orù eze, iwu, si,


Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam, na Akboa, na Shefan, na Asaia, we jekuru Hulda, bú onye-amuma-nwayi, nwunye Shalum nwa Tikva, nwa Hahas, onye nēdebe uwe ndi-nchu-àjà; (ma nwayi ahu nēbi na Jerusalem n'obodo nke-abua;) ha we gwa ya okwu.


O rue, n'arọ nke-iri-na-asatọ nke eze Josaia, na eze zigara Shefan nwa Azalaia, nwa Meshulam, bú ode-akwukwọ, n'ulo Jehova, si,


Jehoiakin b͕ara arọ iri na asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze nime Jerusalem ọnwa atọ: aha nne-ya bu Nehushta nwa Elnetan nke Jerusalem.


Ndi-isi Juda we nu ihe ndia, ha we si n'ulo eze rigota n'ulo Jehova; ha we nọdu ala n'oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova.


Jehoiakim, bú eze, we ziga ndikom n'Ijipt, bú Elnetan nwa Akboa, na ndikom ufọdu so ya, ijeru Ijipt:


Ma otú ọ di, aka Ahaikam nwa Shefan di n'akuku Jeremaia, ka ha we ghara inye ya n'aka ndi Israel ime ka ọ nwua.


Ọzọ kwa, Elnetan na Delaia na Gemaraia riọrọri eze arìriọ ka ọ ghara isure akwukwọ-npiakọta ahu: ma o geghi ha nti.


Ndi-isi we si eze, Biko, ka eme ka nwoke a nwua; n'ihi na ya onwe-ya nēme ka aka ndi-agha kuda, bú ndi fọduru n'obodo a, na aka ndi Israel nile, n'igwa ha okwu dika okwu ndia: n'ihi na nwoke a adighi-achọrọ ndi nka udo, kama ọ bu ihe ọjọ.


O rue, n'ọnwa nke-asa, na Ishmael nwa Netanaia, nwa Elishama, onye sitere na nkpuru ndi nwe ala-eze, onye bu kwa otù nime ndi-isi nke eze, ya na-ndikom iri, biakutere Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa; ha we rikọ nri n'ebe ahu na Mizpa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan