Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 35:6 - Bible Nso

6 Ha we si, Ayi agaghi-aṅu manya-vine: n'ihi na Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, nyere ayi iwu, si, Unu aṅula manya-vine, unu onwe-unu, na umu-unu, rue mb͕e ebighi-ebi:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ma ha zara sị, “Anyị adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na nna nna anyị Jehonadab nwa Rekab nyere anyị iwu sị anyị, ‘Unu aṅụkwala mmanya, unu na ụmụ ụmụ unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 35:6
21 Iomraidhean Croise  

Umu-okoro ahu we tó etó: Isọ we buru nwoke mara ichu ntá, onye ọhia; ma Jekob bu nwoke zuru okè, nēbi n'ulo-ikwū.


N'ihi na àkù-ha riri nne kari ibikọ n'otù nke ọnọdu-ọbìa-ha nile apughi kwa inagide ha n'ihi anu-ulo-ha.


O si n'ebe ahu je, we huta Jehonadab nwa Rikab, ka ọ nābia izute ya: ọ gọzie ya, si ya, Obi-gi, ò ziri ezi, dika obim di n'ebe obi-gi di? Jehonadab we si, Otú a ka ọ di. Ọ buru na ọ di otú a, nyem aka-gi. O we nye ya aka-ya; o we me ka ọ rigo n'ub͕ọ-ala-ya.


Jihu we ba, ya na Jehonadab nwa Rikab, n'ulo Beal; ọ si ndi nēfè Beal, Chọsienu ike, hu, ka otù nime ndi nēfè Jehova ghara idi n'ebe a n'etiti unu, kama ndi nēfè Beal, nání ha.


Mb͕e unu bu ndikom ole-na-ole; E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya;


Ab͕uru nile kwa nke ndi-ode-akwukwọ ndi bi na Jebez; ndi-Tiratait, ndi-Shimeatait, ndi-Sukatait. Ndia bu ndi-Kinait, ndi nēsite na Hamat, bú nna ulo Rikab.


Mb͕e ha bu ndikom ole-na-ole, E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya;


Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.


ayi we biri n'ulo-ikwū, we ge nti, me dika ihe nile si di nke Jonadab, bú nna-ayi, nyere ayi n'iwu.


Emewo ka okwu nile nke Jonadab nwa Rikab guzosie ike, bú nke o nyere umu-ya n'iwu, ka ha ghara iṅu manya-vine, ha aṅughi kwa manya-vine rue ta, n'ihi na ha anuwo ihe nke nna-ha nyere n'iwu: ma Mu onwem agwawo unu okwu, nēbili n'isi-ututu nēkwu; ma unu egeghm nti.


Aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom tiyere gi, mb͕e unu nābà n'ulo-ikwū nzute, ka unu we ghara inwu; ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile:


N'ihi na ọ gābu onye uku n'anya Onye-nwe-ayi, ọ gaghi-aṅu kwa manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ma-ọli; agēme kwa ka o juputa na Mọ Nsọ, ọbuná site n'afọ nne-ya.


Ndi m'huru n'anya, ariọm unu dika ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa, ka unu ghara ime ihe ọjọ di iche iche nāgu anu-aru, nke bu ihe nēbu agha imegide nkpuru-obi;


Ọ gaghi-eri ihe sitere n'ihe ọ bula nke nēsi n'osisi vine nke manya-vine puta, ya aṅu-kwa-la manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ya eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú; ihe nile nke m'nyere ya n'iwu ka ọ gēdebe.


o we sim, Le, i gaje itu ime, mua nwa-nwoke; ma ub͕u a aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú: n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka nwata ahu gābu site n'afọ rue ubọchi ọnwu-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan