Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 35:14 - Bible Nso

14 Emewo ka okwu nile nke Jonadab nwa Rikab guzosie ike, bú nke o nyere umu-ya n'iwu, ka ha ghara iṅu manya-vine, ha aṅughi kwa manya-vine rue ta, n'ihi na ha anuwo ihe nke nna-ha nyere n'iwu: ma Mu onwem agwawo unu okwu, nēbili n'isi-ututu nēkwu; ma unu egeghm nti.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 ‘Jehonadab nwa Rekab nyere ụmụ ụmụ ya iwu sị ha aṅụla mmanya, ha na-edebe iwu ahụ. Ruo taa, ha adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na ha na-edebe iwu nna nna ha nyere ha. Ma mụ onwe m agwala unu okwu mgbe na mgbe, ma unu jụrụ irubere m isi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 35:14
15 Iomraidhean Croise  

Ma ha juru Gi aju, nupu isi megide Gi, tufue iwu-Gi n'azu ha, b͕ue ndi-amuma-Gi ndi b͕ara àmà megide ha ime ka ha chigharikute Gi, ha we me oké ihe-nlelì.


Ma I nēme ka ọtutu arọ di ogologo n'isi ha, I we were Mọ-Gi b͕a àmà megide ha site n'aka ndi-amuma-Gi: ma ha aṅaghi nti: I we nye ha n'aka ndi di iche iche nke ala ọzọ.


N'ihi na ndi nke nānupu isi ka ọ bu, umu nēkwu okwu-ugha, umu nēkweghi inu iwu Jehova:


Gini mere onye ọ bula adighi mb͕e M'biara? gini mere onye-ọziza adighi mb͕e M'kpọrọ òkù? ọ̀ bu na akam dikara nkpunkpu ma-ọli ib͕aputa? ma-ọbu ọ̀ dighi ike di nimem inaputa? Le, n'ibasi-nba-ikem anameme ka oké osimiri tasia, anameme osimiri ka ha ghọ ọzara: azù-ha nēsì ísì, n'ihi na miri adighi, we nwua n'akpiri-ikpọ-nku.


N'ihi na ab͕aworom nna-unu-ha àmà nke-uku n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, rue ta, nēbili n'isi-ututu nāb͕a àmà, si, Genu nti olum.


ige nti okwu nile nke ndi-orùm, bú ndi-amuma, ndi Mu onwem nēzitere unu, nēbili kwa n'isi-ututu nēzite ha, ma unu egeghi nti;


n'ihi na ha egeghi nti okwum nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), nke M'zigara ha ndi-orùm, bú ndi-amuma, igwa ha, nēbili n'isi-ututu nēziga ha; ma unu egeghi nti; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ha we b͕akutam azu, ha echeghm iru: anameme kwa ka ha muta ihe, nēbili n'isi-ututu nēme ka ha muta, ma ha adighi-anu inara idọ́-aka-na-nti.


N'ihi na umu Jonadab nwa Rikab emewo ka ihe ahu nna-ha nyere n'iwu guzosie ike, bú nke o nyere ha n'iwu, ma ndi nka egeghm nti;


Ha we si, Ayi agaghi-aṅu manya-vine: n'ihi na Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, nyere ayi iwu, si, Unu aṅula manya-vine, unu onwe-unu, na umu-unu, rue mb͕e ebighi-ebi:


Ma ub͕u a, n'ihi na unu aluwo ọlu ndia nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'we gwa unu okwu, nēbili n'isi-ututu nēkwu, ma unu anughi; M'we kpọ unu òkù, ma unu azagh:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan