Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 34:20 - Bible Nso

20 M'gēwere ha nye n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha: ozu-ha ewe ghọrọ anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anu-ọhia nke uwa, ihe-oriri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 ka m ga-enyefe nʼaka ndị iro ha ndị na-achọ iwepụ ndụ ha. Ozu ha ga-abụ ihe oriri nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 34:20
25 Iomraidhean Croise  

Onye nke Jeroboam nke nwuru anwu n'obodo, nkita gēri ya; onye nke nwuru anwu n'ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya: n'ihi na Jehova ekwuwo ya.


Onye nke Beasha nke nwuru anwu n'obodo, nkita gēri ya; onye nke ya nke nwuru anwu n'ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya.


Ha ewerewo ozu ndi-orù-Gi nye iburu anu-ufe nke elu-igwe ihe-oriri, Were kwa anu-aru nke ndi-ebere-Gi nye anu-ọhia nile nke uwa.


N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi Anatot, bú ndi nāchọ ndu-gi, si, I gaghi-ebu amuma n'aha Jehova, ka i we ghara inwu site n'aka-ayi:


Ọ̀ bu udele turu agwa ka ihe-nketam dirim? udele, hà nọ ya buruburu nēmegide ya? jenu, chikọta anu ọhia nile, me ka ha bia iri ihe.


Site n'ọnwu nke ọria di iche iche ka ha gānwu; agaghi-etiri ha aka n'obi, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n'elu ala ka ha gāghọ: ha gēsite kwa na mma-agha, site kwa n'oké unwu, gwusia; ozu-ha gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri.


M'gāwusi kwa ndum-ọdu Juda na Jerusalem n'ebe a dika miri; M'gēme kwa ka ha da site na mma-agha n'iru ndi-iro-ha, na site n'aka ndi nāchọ ndu-ha: M'gēnye kwa ozu-ha iburu anu-ufe nke elu-igwe, na iburu anumanu nke uwa, ihe-oriri.


Ma emesia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-orù-ya, na ndim, bú ndi puru n'ajọ ọria ahu nke nēfe efe, pu kwa na mma-agha, na n'oké unwu, fọduru n'obodo a, nye ha n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha: ọ gēji kwa ọnu mma-agha tib͕u ha; ọ gaghi-emere ha ebere, ọ gaghi-enwe kwa ọmiko, ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere.


M'gēnye kwa gi n'aka ndi nāchọ ndu-gi, na n'aka ndi gi onwe-gi nātu ujọ ha, bú n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi Kaldea.


Eze, bú Zedekaia, we ṅuara Jeremaia iyi na nzuzo, si, Jehova nādi ndu, bú Onye ahu nke nyere ayi ndu a, m'gaghi-eme ka i nwua ma-ọli, m'gaghi-enye kwa gi ma-ọli n'aka ndikom ndia ndi nāchọ ndu-gi.


Eze Babilon we b͕ue umu-ndikom Zedekaia nime Ribla n'anya-ya: ọ bu kwa ndi nile nke Juda amara aha-ha ka eze Babilon b͕uru.


Ma gi onwe-gi, mb͕e ebibiworo gi, gini ka i gēme? Mb͕e i geyi uwe uhie, mb͕e i gēke ihe-ichọ-nma ọla-edo, mb͕e i gēji ihe-ichọ-nma me ka anya-gi abua sa mbara, n'efu ka i nēme onwe-gi ka i ma nma; ndi-iko-gi ajuwo gi, ndu-gi ka ha nāchọ.


otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje inye Fero Họfra, bú eze Ijipt, n'aka ndi-iro-ya, na n'aka ndi nāchọ ndu-ya; dika M'nyere Zedekaia, bú eze Juda, n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, bú onye-iro-ya, nke nāchọ kwa ndu-ya.


M'gēme kwa ka Ilam tua ujọ n'iru ndi-iro-ha na n'iru ndi nāchọ ndu-ha: M'gēme kwa ka ihe ọjọ biakwasi ha, bú iwe di ọku nkem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēziga kwa mma-agha n'azu ha, rue mb͕e M'mere ka ha gwusia:


Ozu ndi nka gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri; ọ dighi kwa onye nāruli ha.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje inye gi n'aka ndi i nākpọ asì, n'aka ndi nkpuru-obi-gi kewapuworo n'ebe ha nọ:


M'gātusa kwa gi n'ọzara, gi na azù nile nke osimiri Nail i nile: n'ọhia ka i gāda; agaghi - achikọta gi, agaghi-ekpokọta kwa gi: anu-ọhia nke uwa na anu-ufe nke elu-igwe ka M'wereworo gi nye ka i ghọ ihe-oriri.


M'gātusa kwa gi n'ala-gi, n'ọhia ka M'gētufu gi, me kwa ka anu-ufe nile nke elu-igwe bekwasi gi, M'gēme kwa ka anu-ọhia nke uwa nka nile riju afọ site n'anu-aru-gi.


Ozu-gi gābu-kwa-ra anu-ufe nile nke elu-igwe, bu-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri, onye-nchuli adighi kwa.


Onye Filistia ahu we si Devid, Biakutem, ka m'were kwa anu-aru-gi nye anu-ufe nke elu-igwe na anumanu nke ọhia.


Ubọchi ta ka Jehova gēmechibido gi nye n'akam; m'gētib͕u kwa gi, wezuga isi-gi n'aru gi; m'gēwere kwa ozu ndi ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia nye anu-ufe nke elu-igwe, nye kwa anu-ọhia nke uwa ta; ka uwa nile we mara na Chineke diri Israel:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan