Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 34:19 - Bible Nso

19 bú ndi-isi Juda, na ndi-isi Jerusalem, na ndi-onozi, na ndi-nchu-àjà, na ndi nile nke ala nka, ndi gabigaworo n'etiti nkpọwa abua nke nwa-ehi ahu;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ndị ndu Juda na Jerusalem na ndị ozi eze na ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a ndị si nʼetiti ọkara nwa ehi ahụ gabiga

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 34:19
14 Iomraidhean Croise  

O rue na, mb͕e anyanwu dasiri, mb͕e ọ b͕a-kwa-ra ọchichiri, le, ite-ọku nke nākwu anwuru, na ọwa nke nēnwu ọku nke gabigara n'etiti iberibe anu ahu.


Ọ si, Onye-nwe-ayi, bú Jehova, #m'gēji gini mara na m'gēnweta ya?


Jehoiakin, bú eze Juda, we pukuru eze Babilon, ya onwe-ya, na nne-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-onozi-ya: eze Babilon we jide ya n'arọ nke-asatọ nke ọ bu eze.


O me-kwa-ra ka Jehoiakin je biri na Babilon; nne eze, na ndinyom eze, na ndi-onozi-ya, na ndi-dike nke ala ahu, ndia ka ọ mere ka ha si na Jerusalem je na Babilon ibu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ.


(mb͕e Jekonaia, bú eze, na eze-nwanyi, na ndi-onozi, na ndi-isi Juda na Jerusalem, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, pusiri na Jerusalem;)


ndi-isi nile na ndi Israel nile we nuru, bú ndi bàra n'ọb͕ub͕a-ndu ahu, izilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, inwere onwe-ha, ka madu ọ bula we ghara ime kwa ka ha fè ya òfùfè-orù ọzọ; ha we nuru, zilaga ha:


Ebed-melek, bú onye Etiopia, onye bu onozi, nke nọ n'ulo eze, we nuru na ha tiyereri Jeremaia n'olùlù; ma eze nānọdu n'ọnu-uzọ-ama Benjamin;


Eze Babilon we b͕ue umu-ndikom Zedekaia nime Ribla n'anya-ya: ọ bu kwa ndi nile nke Juda amara aha-ha ka eze Babilon b͕uru.


O we me ka Okwu-Ya nile guzosie ike, bú nke O kwuru megide ayi, megide kwa ndi-ikpe-ayi ndi kpere ayi ikpe, n'ime ka ihe ọjọ uku biakwasi ayi: n'ihi na emeghi n'okpuru elu-igwe nile otú emeworo na Jerusalem.


ayi egeghi kwa nti ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, ndi gwara ndi-eze-ayi na ndi-isi-ayi na nna-ayi-hà, gwa kwa ndi nile nke ala-ayi, okwu n'aha-Gi.


Onye-nwe-ayi, ayi ka ihere iru diri, ọ diri ndi-eze-ayi, di-kwa-ra ndi-isi-ayi, di-kwa-ra nna-ayi-hà, n'ihi na ayi emehiewo megide Gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan