12 okwu Jehova we rue Jeremaia nti site na Jehova, si,
12 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
ma emesia ha chighariri, me ka ndi-orù-ha ndikom na ndinyom ndi nējere ha ozi, bú ndi ha zilagarari inwere onwe-ha, lata, ha we buda ha ka ha buru orù-ndikom na ndinyom nējere ha ozi:
Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Mu onwem na nna-unu-ha b͕ara ndu n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta, si,