Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 34:10 - Bible Nso

10 ndi-isi nile na ndi Israel nile we nuru, bú ndi bàra n'ọb͕ub͕a-ndu ahu, izilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, inwere onwe-ha, ka madu ọ bula we ghara ime kwa ka ha fè ya òfùfè-orù ọzọ; ha we nuru, zilaga ha:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ya mere, ndịisi ọchịchị niile, na ndị niile bụ ndị kwekọrịtara gbaa ndụ a, na ha ga-ahapụ ohu ha ndị nwoke na ndị nwanyị ka ha nwere onwe ha. Ha mekwara dịka ha si kwuo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 34:10
12 Iomraidhean Croise  

Mb͕e i b͕ata orù, bú onye-Hibru, arọ isi ka ọ gābu orù-gi: ma n'arọ nke-asa ọ gāpu nwere onwe-ya n'efu.


Onye-nwe-ayi we si, N'ihi na ndi nka abiaruwo nso n'ọnu-ha, were kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ha sọpurum, ma ha emewo ka obi-ha di anya n'ebe M'nọ, egwu ha nāturum ewe buru ihe madu nyere n'iwu nke emere ka ha muta:


Ndi-isi Juda we nu ihe ndia, ha we si n'ulo eze rigota n'ulo Jehova; ha we nọdu ala n'oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova.


Ndi-isi na ndi Israel nile we si ndi-nchu-àjà, si kwa ndi-amuma, Ọ dighi ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n'ihi na ọ bu n'aha Jehova, bú Chineke-ayi, ka gwaworo ayi okwu.


ma emesia ha chighariri, me ka ndi-orù-ha ndikom na ndinyom ndi nējere ha ozi, bú ndi ha zilagarari inwere onwe-ha, lata, ha we buda ha ka ha buru orù-ndikom na ndinyom nējere ha ozi:


bú ndi-isi Juda, na ndi-isi Jerusalem, na ndi-onozi, na ndi-nchu-àjà, na ndi nile nke ala nka, ndi gabigaworo n'etiti nkpọwa abua nke nwa-ehi ahu;


o we rida n'ulo eze, rue ime-ulo nke ode-akwukwọ: ma, le, n'ebe ahu ka ndi-isi nile nānọdu, bú Elishama ode-akwukwọ, na Delaia nwa Shemaia, na Elnetan nwa Akboa, na Gemaraia nwa Shefan, na Zedekaia nwa Hananaia, na ndi-isi nile.


Ndi-isi we si eze, Biko, ka eme ka nwoke a nwua; n'ihi na ya onwe-ya nēme ka aka ndi-agha kuda, bú ndi fọduru n'obodo a, na aka ndi Israel nile, n'igwa ha okwu dika okwu ndia: n'ihi na nwoke a adighi-achọrọ ndi nka udo, kama ọ bu ihe ọjọ.


Unu gēdo kwa arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu nsọ, kpọsa kwa n'ala ahu nile si na ndi nile bi nime ya nwere onwe-ha: jubile ka arọ ahu gāburu unu; unu gālaghachi kwa, onye ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, laghachi kwa, onye ọ bula n'ab͕uru-ya.


n'ihi na Herod nātu egwu Jọn, ebe ọ matara na ọ bu nwoke nke bu onye ezi omume na onye di nsọ, ọ nēdebe kwa ya nke-ọma. Ọzọ, mb͕e ọ nuru okwu-ya, ọ nēchè uche nke-uku; o were kwa obi-utọ nānu ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan