Jeremaya 33:5 - Bible Nso5 Ha nābia ibuso ndi Kaldea agha, na imeju ha n'ozu madu ndi M'tib͕uworo n'iwem na n'ọnumam, ndi M'zonariwo-kwa-ra obodo a irum n'ihi ihe ọjọ nile ha. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a5 nʼagha a na-alụso ndị Babilọn. ‘Aga eji ozu ndị mmadụ ahụ niile m ga-etigbu site nʼiwe m na nʼọnụma m kpojuo ha. Aga m ezo ihu m site nʼebe obodo a nọ, nʼihi ajọ omume ya niile. Faic an caibideil |
N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n'aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n'aru unu, mb͕e unu batara n'Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ.