Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 33:26 - Bible Nso

26 ya bu na M'gāju nkpuru Jekob, na Devid, bú orùm, M'we ghara isi na nkpuru-ya were ndi ganāchi nkpuru nke Abraham na Aisak na Jekob: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 mgbe ahụ, agaara m ajụ ụmụ ụmụ Jekọb, na ụmụ ụmụ Devid ohu m. Agaraghị m ahọpụta otu nʼime ụmụ ya ka ọ chịa ụmụ ụmụ Ebraham na Aịzik na Jekọb. Ma aga m eme ka ndị ha a dọtara nʼagha lọta; aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ha.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 33:26
17 Iomraidhean Croise  

Nkpa-n'aka eze agaghi-esi n'ebe Juda nọ wezuga onwe-ya, Nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru agaghi-esi kwa n'etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya, Rue mb͕e Shailo gābia; Ọ bu kwa ya gēnwe iṅa-nti ndi di iche iche.


Ma ndia bu umu ala ahu anāchi achi ndi nārigo, bú ndi sitere na ndọta-n'agha ahu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha je biri na Babilon, ha we laghachi na Jerusalem na Juda, nwoke ọ bula n'obodo-ya;


Ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ufọdu nime ndi Juda, na ndi-ọbù-abù, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na Netinim, we biri n'obodo nile ha, Israel nile bi-kwa-ra n'obodo nile ha.


Mb͕e Jehova mere ka ndi nālata na Zaion lata, Ayi di ka ndi nārọ nrọ.


N'ihi na Jehova gēnwe obi-ebere n'aru Jekob, Ọ gārọputa kwa Israel ọzọ, do ha n'ala-ha: ọbìa gārapara kwa n'aru ha, ha gēme kwa onwe-ha ka ha na ulo Jekob dikọ n'otù.


Na nrubiga-ókè nke iwe ka M'zonariri gi irum otù ntabi-anya; ma ebere ebighi-ebi ka M'gēji nwe obi-ebere n'aru gi, ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa-gi, siri.


Je, kpọsa okwu ndia n'uzọ Ugwu, si, Lata, gi Israel nke nādaghachi azu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; M'gaghi-edo unu iru iwe: n'ihi na onye-ebere ka M'bu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gaghi-edebe iwe rue mb͕e ebighi-ebi.


Efraim, ọ̀ bu nwa-nwoke di oké ọnu-ahia M'nwere? ọ̀ bu nwa nātọm utọ nke-uku? n'ihi na ka mb͕e ra M'nēkwu okwu megide ya, anamecheta ya nke-ọma rue ub͕u a: n'ihi nka ngiri-afọm adaworo ya udà; aghaghm inwe obi-ebere n'aru ya ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Otú a ka Jehova siri, bú Onye nēnye anyanwu ka ọ buru ìhè n'ehihie, na ukpuru nile nke ọnwa na nke kpakpando nile ka ha buru ìhè n'abali, Onye nēme ka oké osimiri dere du mb͕e nmali-miri-ya nile nēbib͕ọ; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya:


Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na agātù elu-igwe nke di n'elu, ọ buru kwa na egwuputa ntọ-ala nile nke uwa nke di n'okpuru, Mu onwem gāju kwa nkpuru nile nke Israel n'ihi ihe nile nke ha meworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ì hughi ihe ndi nka kwuworo, si, Ab͕uru abua nke Jehova rọputara, Ọ juworo ha? ọ bu kwa ndim ka ha nēlelì anya, ha we ghara ibu kwa mba n'iru ha ọzọ.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ub͕u a ka M'gēme ka ndi Jekob adọtara n'agha lata, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ulo Israel nile; M'gēkwo-kwa-ra aha nsọm ekworo.


Ma n'aru ulo Juda ka M'gēnwe obi-ebere, M'gēji kwa Jehova, bú Chineke-ha, zọputa ha, ma M'gaghi-eji uta, ma-ọbu mma-agha, ma-ọbu agha, ma-ọbu inyinya, ma-ọbu ndi-inyinya, zọputa ha.


M'gāgha-kwa-ra ya Onwem n'ala-ya dika nkpuru ọghigha; M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru Lo-ruhama; M'gāsi kwa Lo-ami, Ndim ka i bu; ndi ahu gāsi kwa, Chinekem.


M'gēme kwa ka ulo Juda di ike, M'gāzọputa kwa ulo Josef, me ka ha lata, n'ihi na enwerem obi-ebere n'aru ha: ha gādi kwa ka agāsi na achupughm ha-ri: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, M'gāza kwa ha.


N'ihi na Chineke mechibidoro ha nile nime ekweyeghi-ekweye, ka O we mere ha nile ebere.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan