Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 33:21 - Bible Nso

21 ya bu na agēmebi ọb͕ub͕a-ndum, nke Mu na Devid, bú orùm, b͕ara, ka o we ghara inwe nwa-nwoke nke bu eze n'elu oche-eze-ya; na ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi Livai, bú ndi-nchu-àjà, ndi nējerem ozi, b͕ara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 mgbe ahụ ọgbụgba ndụ nke mụ na Devid ohu m gbara, na ọgbụgba ndụ nke m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na ndị Livayị, bụ ndị nchụaja na-eje ozi ha nʼihu m, agaghị adịkwa. A gaghị enwekwa onye ga-esi nʼezinaụlọ Devid nke ga-anọkwasị nʼocheeze ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 33:21
16 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ọ bughi otú a ka ulom di n'ebe Chineke nọ; N'ihi na ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Ọ b͕aworo nyem, Bú ọb͕ub͕a-ndu edoworo n'usoro n'ihe nile, nke edebewo-kwa-ra: N'ihi na nzọputam nile, na ihe-utọ nile, N'ezie Ọ gaghi-eme ka o pute.


Ma Jehova ekweghi ibibi ulo Devid, n'ihi ọb͕ub͕a-ndu ahu Ya na Devid mere, dika Ọ si-kwa-ra na Ọ gēnye ya oriọna, nye kwa umu-ya, ubọchi nile.


M'gēme kwa ka oche-eze ala-eze-gi guzosie ike, dika Mu na Devid, bú nna-gi, b͕ara ndu, M'we si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'ichi Israel.


N'ebe ahu ka M'gēme ka mpi Devid nwere pue: Edoworom onye nkem etere manu oriọna n'usoro.


M'gagh-eme ka ọb͕ub͕a-ndum ghara idi nsọ, Ọzọ, M'gagh-agbanwe ihe siworo n'eb͕ub͕ere-ọnum abua puta.


Nkpuru-ya gādiru mb͕e ebighi-ebi, Oche-eze-ya gādi kwa ka anyanwu n'irum.


Tọnu nti-unu n'ala, biakutem; nurunu, nkpuru-obi-unu ewe di ndu: Mu na unu gāb͕a kwa ndu, bú ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, bú ebere nile kwesiri ntukwasi-obi nke emere Devid.


N'ihi na dika elu-igwe ọhu na uwa ọhu, nke Mu onwem nēme, ganēguzo n'irum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), otú a ka nkpuru-unu na aha-unu gēguzo.


ọzọ, agaghi-ebipu n'ulo ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, n'irum onye nwe isure àjà-nsure-ọku, na isure onyinye-inata-iru-ọma dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì, utọ, na ichu àjà ubọchi nile.


Ọ bu kwa ya ka enyere ọchichi, na ebube, na ala-eze, ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nile nāsu asusu di iche iche we fè Ya: ọchichi-Ya bu ọchichi ebighi-ebi, nke nāgaghi-agabiga, ọ bu kwa ala-eze-Ya bu nke anāgaghi-emebi.


Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.


I we me ha ka ha buru ala-eze na ndi-nchu-àjà nye Chineke-ayi; ha bu kwa eze n'elu uwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan