Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 33:11 - Bible Nso

11 agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'ihi na Jehova di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n'ulo Jehova. N'ihi na M'gēme ka ndi ala nka adọtara n'agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 olu ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị ahụ niile na-eweta onyinye ekele nʼụlọ Onyenwe anyị, ndị ahụ ga-asị, “ ‘ “Nyenụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekele nʼihi na Onyenwe anyị dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” Nʼihi na aga m eme ka ndị ala a, nke a dọtara nʼagha lọta, dịkwa ka ha dị na mbụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 33:11
47 Iomraidhean Croise  

Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.


Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya; Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa.


O we me ka ndi-ya dua ya ọdu, o we guzo ndi nābùku Jehova abù, ndi nēto kwa ima-nma nke idi-nsọ, mb͕e ha nāpu n'obodo n'iru ndi ejikere agha, si, Kelenu Jehova; n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.


Hezekaia we za, si, Ub͕u a unu emejuwo aka-unu n'ebe Jehova nọ, bianu nso webata àjà na àjà-ekele n'ulo Jehova. Nkpọkọta Juda we webata àjà na àjà-ekele; onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo weta-kwa-ra àjà-nsure-ọku.


o we rue, mb͕e ndi nāfù opì na ndi-ọbù-abù di ka otù onye, ime ka anu otù olu n'ito na n'ikele Jehova, mb͕e ha were kwa opì na ájà, na ihe abù, na otuto eji to Jehova, welie olu-ha elu, si, N'ihi na Ọ di nma: n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na igwe-oji juputara ulo ahu, bú ulo Jehova,


Umu Israel nile nēlekwasi kwa nrida ọku ahu anya, ya na ebube Jehova nke di n'elu ulo ahu; ha we ruru ala, kpuchie iru-ha n'ala n'elu pavement, kpọ isi ala, we kele Jehova, si, N'ihi na Ọ di nma; n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.


ha we were ọṅù me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa: n'ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu, O me-kwa-ra ka obi eze Asiria chigharia n'ebe ha nọ, ime ka aka-ha di ike n'ije-ozi nke ulo Chineke, bú Chineke Israel.


Ha we chua àjà uku n'ubọchi ahu, we ṅuria; n'ihi na Chineke mere ka ha ṅuria ọṅu uku; ọzọ kwa, ndinyom-ha na umu-ntakiri-ha ṅuriri: ewe nu ọṅù Jerusalem rue ebe di anya.


Ndi ahu nile we je iri ihe, na iṅu ihe ọṅuṅu, na iziga òkè, na ime ka oké ọṅù di, n'ihi na ha ghọtara okwu nile nke emere ka ha mara.


Tonu Ja. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.


Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.


Ka ha chu kwa àjà nile nke ekele, Were kwa iti-nkpu-ọṅù kọ akukọ ọlu-Ya nile.


Gi ka m'gāchuru aja ekele, Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku.


N'ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi nile di ike; Ọ gọziwo umu-gi n'etiti gi.


Jehova, me ka ayi hu ebere-Gi, Nye kwa ayi nzọputa-Gi.


ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ewe b͕alaga.


Ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ab͕alawo.


N'ihi na Jehova akasiwo Zaion obi: Ọ kasiwo nkpọnkpọ ebe-ya nile, me ka ọzara-ya di ka Iden, me ka ala-ya nke ihe nādighi di ka ubi Jehova ab͕ara ogige; obi-utọ na ọṅù ka agāhu nime ya, na ekele, na olu abù ọma.


Nuru olu ndi-nche-gi! ha eweliwo olu-ha, n'otù ka ha nētikọ nkpu ọṅù; n'ihi na anya na anya ka ha gāhu mb͕e Jehova nālaghachikute Zaion.


Tiwanu nkpu ọṅù, tienu nkpu ọṅù n'ọtù, unu nkpọnkpọ ebe nke Jerusalem: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ b͕aputawo Jerusalem.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje ime ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nwoke nālu nwunye ọhu na olu nwanyi anālu ọhu kwusi n'ebe a n'anya-unu na n'ubọchi-unu.


Ha gēsi kwa n'obodo nile nke Juda, si kwa n'ebe nile di Jerusalem buruburu, si kwa n'ala Benjamin, si kwa n'ebe di ala ala, si kwa n'ugwu, si kwa na Negeb, bia, nēwebata ihe àjà-nsure-ọku, na àjà ọzọ, na onyinye-inata-iru-ọma, na frankincense, nēwebata kwa ekele, n'ulo Jehova.


Ọzọ, M'gēme ka olu obi-utọ, na olu ọṅù, na nwoke nālu nwunye ọhu, na olu nwanyi anālu ọhu, na olu nkume-igwe-nri, na ìhè oriọna, lanari ha n'iyì.


M'gēkwe kwa ka unu chọtam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēme kwa ka ndi-unu adọtara n'agha lata, M'gēsi kwa na mba nile, na n'ebe nile M'chugaworo unu, chikọta unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka unu lata n'ebe ahu nke M'mere ka unu si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ.


Ekele na olu nke ndi-ngwuri gēsi kwa nime ha puta: M'gēme kwa ka ha ba uba, ha agaghi-adi kwa ole-na-ole; M'gēme kwa ka ha di nsọpuru ha agaghi-adi kwa ntà.


N'ihi na, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka ndim lata, bú Israel na Juda, ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka ha lata n'ala ahu nke M'nyere ndi bu nna-ha, ha gēnweta kwa ya.


Ubi ka agāzú nēgo, de kwa aha n'akwukwọ-ha, ka kwa ha akàrà, kpọ kwa ndi-àmà, n'ala Benjamin, na n'ebe nile di Jerusalem buruburu, na n'obodo nile nke Juda, na n'obodo nile nke ugwu, na n'obodo nile nke ebe di ala ala, na n'obodo nile nke Negeb: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


ya bu na M'gāju nkpuru Jekob, na Devid, bú orùm, M'we ghara isi na nkpuru-ya were ndi ganāchi nkpuru nke Abraham na Aisak na Jekob: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ha.


M'gēme kwa ka ndi Juda adọtara n'agha na ndi Israel adọtara n'agha lata, M'gēwu kwa ha dika ulo, dika na mbu.


M'gēme kwa ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu kwusi n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: n'ihi na nkpọnkpọ ebe ka ala nka gāghọ.


M'gēme kwa ka ndim adọtara n'agha, bú Israel, lata, ha gēwu kwa obodo nile tọb͕ọrọ n'efu, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ṅua manya-ha; ha gēme kwa ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha.


Ma mu onwem gēji olu ekele chuara Gi àjà; Ihe nke m'kweworo na nkwa ka m'gākwughachi. Nzọputa diri Jehova.


Jehova di nma, Ọ bu ebe ewusiri ike n'ubọchi ahuhu; Ọ bu kwa onye nāma ndi nāgbabà nime Ya.


Tie nkpu ọṅù, gi ada Zaion; tie nkpu, gi Israel; ṅuria, were obi nile ṅuria ọṅu-agha, gi ada Jerusalem.


Ndi Efraim gādi kwa ka dike, obi-ha gāṅuri kwa ọṅu dika site na manya-vine: e, umu-ha gāhu ya, we ṅuria; obi-ha gēteghari egwú ọṅù nime Jehova.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Obubu-ọnu nke ọnwa nke-anọ, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-ise, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-asa, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-iri, gāghọrọ ulo Juda obi-utọ na ọṅù, na mb͕e akara àkà di nma; hu-kwa-nu ezi-okwu na udo n'anya.


N'ihi na le ka idi-nma-Ya si di uku! le kwa ka ima-nma-Ya si di uku! ọka gemeka umu-okorọbia tozue okè nke-ọma, manya-vine ọhu kwa umu-ab͕ọghọ nke nāmaghi nwoke.


Onye nwere nwunye ọhu bu onye nālu nwunye ọhu: ma enyì nke onye nālu nwunye ọhu, onye nēguzo nānu kwa okwu-ya, ọ nāṅuri ọṅu nke-uku n'ihi olu onye ahu nālu nwunye ọhu: ya mere emezuwo ọṅùm a.


Ya mere, ka ayi site n'aka-Ya nāchu àjà, bú otuto, nye Chineke mb͕e nile, nke ahu bu, nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuputa nye aha-Ya.


ìhè nke oriọna agaghi-enwu kwa nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke onye nālu nwunye ọhu na nke nwanyi anālu ọhu nime gi ọzọ ma-ọli: n'ihi na ndi-ahia-gi buri ndi-amadi nke uwa; n'ihi na ewere igwọ-nsi-gi duhie mba nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan