Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 32:8 - Bible Nso

8 Hanamel nwa nwa-nne nnam we biakutem, dika okwu Jehova si di, rue ogige ulo-nche, sim, Biko, zuru ubim nke di n'Anatot, nke di n'ala Benjamin: n'ihi na gi ka nnweta-ya ruru, ọ bu kwa gi nwe nb͕aputa-ya; zutara onwe-gi. M'we mara na okwu Jehova ka nka bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 “Mgbe ahụ, dịka Onyenwe anyị si kwuo ya, Hanamel nwa nwanne nna m bịakwutere m nʼogige ndị nche sị m, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼime ala ndị Benjamin. Ebe ọ bụ ihe ruuru gị ịgbapụta ya ime ka ọ bụrụ nke gị, ọ bụ gị kwesiri ịzụ ya.’ “Amaara m na nke a bụ okwu Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 32:8
15 Iomraidhean Croise  

Eze we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, La n'Anatot, rue ubi-gi; n'ihi na nwoke kwesiri ọnwu ka i bu: ma m'gaghi-eme ka i nwua n'ubọchi ta, n'ihi na i būru ib͕e Onye-nwe-ayi Jehova n'iru Devid, bú nnam, na n'ihi na ewedara gi n'ala n'ihe nile nke ewedara nnam n'ala nime ya.


Maikaia we si, Le, i ganāhu n'ubọchi ahu, mb͕e i gābà n'ime-ulo nke di n'ime-ulo izo onwe-gi.


site kwa n'ebo Benjamin; Geba na ebe-ita-nri-ya nile, na Alemet na ebe-ita-nri-ya nile, na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile. Obodo-ha nile bu obodo iri na atọ n'ab͕uru-ha nile.


Okwu Jeremaia nwa Hilkaia, onye sitere na ndi-nchu-àjà ndi nọ n'Anatot n'ala Benjamim:


Ma mb͕e ahu usu-ndi-agha eze Babilon nānọchigide Jerusalem n'agha: ma Jeremaia, bú onye-amuma, nọ ka onye eb͕ochibidoworo n'ogige ulo-nche, nke di n'ulo eze Juda.


Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi Jehova, asiwom, Were ego zutara onwe-gi ubi ahu, kpọ kwa ndi-àmà; ma enyewo obodo a n'aka ndi Kaldea.


Le, Hanamel nwa Shalum, bú nwa-nne nna-gi, gābiakute gi, si, Zutara onwe-gi ubim nke di n'Anatot: n'ihi na gi ka nb͕aputa ruru izuru ya.


Okwu Jehova we rue Jeremaia nti nke ub͕ò abua, mb͕e ya onwe-ya nọ ka onye eb͕ochibidoworo n'ogige ulo-nche, si,


na Jeremaia siri na Jerusalem pua ije ala Benjamin, iketa òkè-ya n'ebe ahu, n'etiti ndi Israel.


M'we me otú a, dika enyerem iwu: ihem nile ka m'buputara n'ehihie, dika ihe nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, n'anyasi m'we ji akam gwupuere onwem mb͕idi; n'ọchichiri ka m'bupuru ya, n'ubum ka m'buru ya n'anya-ha.


Ewe nyajie ya n'ubọchi ahu: otú a ndi ewedara n'ala nke ìgwè ewu na aturu ahu, bú ndi nāribam ama, we mara na okwu Jehova ka ọ bu.


Ya mere nna-ya mara na ọ bu n'oge hour ahu mb͕e Jisus siri ya, Nwa-gi nwoke di ndu: ya onwe-ya we kwere na èzí-na-ulo-ya dum.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan