Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 32:4 - Bible Nso

4 ma Zedekaia, bú eze Juda, agaghi-ewepuga onwe-ya n'aka ndi Kaldea, kama aghaghi inye ya n'aka eze Babilon, ha gēkwurita kwa ọnu na ọnu, anya-ya gāhu kwa anya-ya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Zedekaya eze Juda agaghị agbapụ site nʼaka ndị Babilọn, nʼihi na a ga-enyefe ya nʼaka eze Babilọn, onye ya na ya ga-ekwurịtakwa okwu ihu na ihu. Zedekaya ga-ejikwa anya ya abụọ hụ eze Babilọn,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 32:4
13 Iomraidhean Croise  

Ma emesia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-orù-ya, na ndim, bú ndi puru n'ajọ ọria ahu nke nēfe efe, pu kwa na mma-agha, na n'oké unwu, fọduru n'obodo a, nye ha n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha: ọ gēji kwa ọnu mma-agha tib͕u ha; ọ gaghi-emere ha ebere, ọ gaghi-enwe kwa ọmiko, ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere.


Ebe-nb͕alaga alanariwo kwa ndi-ọzùzù-aturu, nb͕apu alanariwo ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu.


Ọ bu kwa Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-isi-ya ka M'gēnye n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha, na n'aka usu-ndi-agha nke eze Babilon, ndi nēsi n'ebe unu nọ rigo la.


ma gi onwe-gi aghaghi-iwepuga onwe-gi n'aka-ya, kama aghaghi iwere gi, ọ bu kwa n'aka-ya ka agēnye gi; anya-gi abua gāhu kwa anya abua nke eze Babilon, unu gēkwurita kwa ọnu na ọnu, ọ bu kwa Babilon ka i gābà.


eze, bú Zedekaia, we ziga, kuta ya: eze we jua ya n'ulo-ya na nzuzo, si, Ọ̀ di okwu ọ bula sitere na Jehova? Jeremaia we si, Okwu di. O we si, N'aka eze Babilon ka agēnye gi.


ma ọ buru na i pukughi ndi-isi eze Babilon, agēnye kwa obodo a n'aka ndi Kaldea, ha gēsure kwa ya n'ọku, gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n'aka-ha.


Ọ bu kwa ndinyom-i nile na umu-gi ka ha ganēme ka ha pukuru ndi Kaldea: gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n'aka-ha, kama aka eze Babilon gējide gi: ọ bu kwa obodo a ka i gēsure n'ọku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan