Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 32:31 - Bible Nso

31 N'ihi na ihe ikpasu iwem na ikpasu ọnumam ka obodo a buruworom site n'ubọchi mb͕e ha wuru ya we rue ta; ka M'we si n'irum wezuga ya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Site nʼoge e wuru ya ruo ugbu a, ndị bi nʼobodo a akpaliela iwe m na ọnụma m. Ya mere, aga m esite nʼihu m wezuga ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 32:31
17 Iomraidhean Croise  

Ọzọ kwa, Manase wusiri ọbara nke-uku ri nne, bú nke nēmeghi ihe ọjọ, rue mb͕e o mejuru Jerusalem site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ; nāgughi nmehie-ya nke o jiri me ka Juda mehie, ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.


Ọzọ kwa, ebe-ichu-àjà nke di na Bet-el, na ebe di elu nke Jeroboam nwa Nebat mere, bú onye mere ka Israel mehie, ọbuná ebe-ichu-àjà ahu na ebe ahu di elu ka ọ kwaturu; o sure ebe ahu di elu ọku, supia ya me ka ọ ghọ uzuzu, sure kwa Ashera ọku.


Jehova we si, M'gēsi kwa n'irum wezuga Juda, dika M'wezugara Israel, M'gāju kwa obodo a nke M'rọputaworo, bú Jerusalem, na ulo ahu nke M'siri, Aham gādi n'ebe ahu.


n'ihi nka, le, Mu onwem, M'gēchezọsi kwa unu, chupu unu na obodo ahu nke M'nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, n'irum:


n'ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu, ime ka unu si n'ala-unu je n'ebe di anya: ka M'we chupu kwa unu, unu ewe la n'iyì.


Jerusalem emehiewo nke-uku; n'ihi nka ka ọ ghọworo ihe ruru árú: Ndi nile ndi nāsọpuru ya-ri elelìwo ya anya, n'ihi na ha ahuwo ọtọ-ya: E, ya onwe-ya ezewo ume, we chigharia azu.


Onye-nwe-ayi, dika ezi omume-Gi nile si di, biko, ka iwe-Gi na ọnuma-Gi si n'obodo-Gi, bú Jerusalem, bú ugwu nsọ Gi, laghachi: n'ihi na ọ bu n'ihi nmehie nile ayi, na n'ihi ajọ omume nile nke nna-ayi-hà, ka Jerusalem na ndi-Gi ghọworo ihe-ita-uta nye ndi nile di ayi buruburu.


Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nneku-ọkuku nāchikọ umu-ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi!


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan