Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 32:24 - Bible Nso

24 Le, obo-ihe ndia atuliri atuli, ha abiaruwo obodo a iwere ya; enyewo kwa obodo a n'aka ndi Kaldea ndi nēbuso ya agha, n'ihi mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe: ihe I kwuworo erèwo kwa; ma, le, I nāhu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 “Lee ka ndị iro si wuo ihe agha ha gburugburu mgbidi obodo a, ihe agha nke ha ga-eji lụta ya nʼagha. I werela obodo a nyefee ndị Babilọn na-ebuso ya agha nʼaka, nʼihi mma agha na ụnwụ, na oke ọrịa dị nʼime ya. Ihe i kwuru na ọ ga-eme emezuola, dịka i si ahụ ya ugbu a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 32:24
35 Iomraidhean Croise  

Ha we bia nọchigide ya n'agha n'Ebel Bet-meaka, wukọta ihe-ntukọba imegide obodo ahu, o we guzo nime ékpè: ndi nile soro Joab nēbibimb͕idi, ime ka ọ da.


N'ihi ya ka Jehova kwuru okwu bayere eze Asiria otú a, si, Ọ gaghi-abà n'obodo a, ọ gaghi-ab͕a otù àkú n'ebe ahu, ọ gaghi-ewere kwa ọta bia n'iru ya, ọ gaghi-awukọta kwa ihe-ntukọba imegide ya.


Site n'ọnwu nke ọria di iche iche ka ha gānwu; agaghi-etiri ha aka n'obi, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n'elu ala ka ha gāghọ: ha gēsite kwa na mma-agha, site kwa n'oké unwu, gwusia; ozu-ha gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri.


M'gēnye kwa ihe nile akpakọbara n'obodo a, na ihe nile putara na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na ihe-ya nile nke di oké ọnu-ahia, e, àkù nile nke ndi-eze Juda ka M'gēnye n'aka ndi-iro-ha, ndi gāluta ihe-ha n'agha, chiri ha, chibà ha na Babilon.


M'gēziga kwa mma-agha na oké unwu na ajọ ọria nēfe efe n'etiti ha, rue mb͕e agēme ka ha gwupusia n'elu ala ahu nke M'nyere ha, nye kwa ndi bu nna-ha.


otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, M'gaje iziga n'etiti ha mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe, M'gēme kwa ha ka ha di ka fig jọb͕uru onwe-ha, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha.


M'gēji kwa mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ọria nēfe efe, chuso ha, M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, ibu ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ibu ihe-iju-anya, na ibu ihe-ima-ọsọ, na ibu ihe-ita-uta, n'etiti mba nile ebe M'chugaworo ha:


Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi Jehova, asiwom, Were ego zutara onwe-gi ubi ahu, kpọ kwa ndi-àmà; ma enyewo obodo a n'aka ndi Kaldea.


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Le, M'gaje inye obodo a n'aka ndi Kaldea, na n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, ọ gēwere kwa ya:


N'ihi na Zedekaia, bú eze Juda, b͕ochibidoro ya-ri, si, Gini mere gi onwe-gi ji ebu amuma, si, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje inye obodo a n'aka eze Babilon, ọ gēwere kwa ya;


Ma ub͕u a n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a bayere obodo a, nke unu onwe-unu nāsi, Enyewo ya n'aka eze Babilon site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe:


ọ bu kwa Babilon ka ọ gēme ka Zedekaia jerue, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ gānọ rue mb͕e M'gēleta ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): mb͕e unu gēbuso ndi Kaldea agha, ọ gaghi-agara unu nke-ọma?


N'ihi na okwu di otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere ulo nile nke obodo a, baye-kwa-ra ulo nile nke ndi-eze Juda, nke akwadaworo imegide obo-ihe nile atuliri atuli na imegide mma-agha, si:


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Unu onwe-unu egeghm nti, ikpọsa, onye o bula ọ gwa nwa-nne-ya, onye ọ bula o gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya: le, M'nākpọsara unu si na unu nwere onwe-unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ibà na mma-agha, na ibà n'ajọ ọria nēfe efe, na ibà n'oké unwu; M'gēwere kwa unu nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.


O rue, n'arọ nke-iteghete nke ọ bu eze, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na Nebukadreza, bú eze Babilon, biara, ya onwe-ya na usu-ndi-agha-ya nile, imegide Jerusalem, ha we ma ulo-ikwū-ha megide ya; ha we wue ulo-agha imegide ya buruburu.


N'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa ahu, oké unwu siri ike n'obodo ahu, ọ dighi kwa nri ndi ala ahu nwere.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Gbutuenu osisi-ya nile, wukọta obo-ihe imegide Jerusalem: nka bu obodo ahu agēleta; ọ bu nání nmeb͕u n'etiti ya.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Àgēsi kwa aṅa naputa ya ma-ọli mb͕e ọ bu ikpém anọ jọrọ njọ, bú mma-agha na oké unwu na ajọ anu-ọhia na ajọ ọria nēfe efe, ka M'zigara na Jerusalem, ibipu madu na anumanu nime ya?


N'aka-nri-ya ka ihe iji ju ase bayere Jerusalem di, ido ihe di iche iche eji etipú mb͕idi, isaghe ọnu n'ob͕ub͕u, iweli olu n'iti nkpu agha, ido ihe di iche iche eji etipú mb͕idi imegide ọnu-uzọ-ama nile, iwukọta obo-ihe, iwu ulo-agha.


Nkpù-iru, nkpù-iru, nkpù-iru ka M'gēkpù-ya: nka kwa, ọ gaghi-adi rue mb͕e ọ gābia, bú onye o ruru aka; M'gēwere kwa ya nye ya.


Umu-gi ndinyom ndi nọ n'ọhia ka ọ gēji mma-agha b͕u: ọ gēwu kwa ulo-agha megide gi, wukọta obo-ihe imegide gi, welie ọta uku imegide gi.


tiye ihe-nnọchigide-n'agha imegide ya, wue ulo-agha imegide ya, wukọta obo-ihe imegide ya; tiye ọmuma-ulo-ikwū di iche iche imegide ya, do ihe di iche iche itipú mb͕idi imegide ya buruburu.


E, mba ahu nākwa ndi-eze emò, ndi-isi bu-kwa-ra ya ihe-ichì-ọchì: mba ahu nāchì ebe ọ bula ewusiri ike ọchì; n'ihi na o nēkpokọba ájá, we were ya.


Ma otú ọ di, okwum nile na ukpurum nile nke M'nyere ndi-orùm, bú ndi-amuma, n'iwu, hà erughi nna-unu-hà aru? ha we chigharia, si, Dika Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubere ime ayi, dika uzọ nile ayi si di, na dika omume nile ayi si di, otú a ka O mesoworo ayi.


Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.


emewom ka elu-igwe na uwa b͕agide unu àmà ta, na unu gālapusi n'iyì ngwa ngwa n'ala ahu nke unu nāgabiga Jọdan ibà n'ebe ahu inweta ya; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n'elu ya, kama agēkpochapu unu ekpochapu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan