Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 32:21 - Bible Nso

21 I we ji ihe-iriba-ama di iche iche, ji kwa ihe-ebude di iche iche, ji kwa aka di ike, ji kwa ogwe-aka setiri eseti, ji kwa egwu di uku, me ka ndi-Gi, bú Israel, si n'ala Ijipt puta;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ọ bụ ihe ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche, nʼaka dị ike, na ogwe aka e setịpụrụ esetipụ, nʼihe oke egwu, ka i ji kpọpụta ndị gị Izrel site nʼIjipt.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 32:21
18 Iomraidhean Croise  

Ma òle mba di ka ndi-Gi, dika Israel, bú otù mba nke nēguzo iche n'uwa, nke Chineke jere ib͕aputara Onwe-ya ka ọ buru otù ndi, na imere Onwe-ya aha, na imere unu ihe-idi-uku a, na imere ala-Gi ihe di egwu, n'iru ndi-Gi, nke I siri n'Ijipt, bú mba di iche iche ọzọ na chi nile ha, baputara onwe-gi?


(n'ihi na ha gānu aha uku Gi, na aka-Gi di ike, na ogwe-aka-Gi esetiri eseti;) mb͕e ọ gābia kwa kpe ekpere n'ulo a;


Ma òle mba di ka ndi-Gi, bú Israel, nke bu otù mba nke nēguzo iche n'uwa, nke Chineke jere ib͕aputara Onwe-ya ibu otù ndi, imere Onwe-gi aha site n'ihe-idi-uku na ihe di egwu, ichupu mba di iche iche n'iru ndi-Gi, ndi I siri n'Ijipt b͕aputa?


O we me ka ha puta chiri ọla-ọcha na ọla-edo: Ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ n'etiti ebo-Ya nile.


O we me ka ndi-Ya ji obi-utọ puta, Me kwa ndi Ọ rọputaworo ka ha ji iti-nkpu-ọṅù puta.


O gēru kwa, mb͕e nwa-gi gāju gi n'ọdi-n'iru, si, Gini bu nka? na i gāsi ya, Ike nke aka ka Jehova jiri me ka ayi si n'Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta:


Ọ gabu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama n'elu aka-gi, na ihe-ncheta n'etiti anya-gi abua, ka iwu Jehova we di n'ọnu-gi: n'ihi na aka di ike ka Jehova jiri me ka i si n'Ijipt puta.


M'gēsetipu kwa akam, tib͕u Ijipt n'oké ọlum nile nke M'gālu n'etiti ya: emesi kwa o gēzilaga unu.


Jehova we si Moses, Ub͕u a ka i gāhu ihe M'gēme Fero: n'ihi na n'aka di ike ka o gēzipu ha, ọ bu kwa n'aka di ike ka ọ gāchupu ha n'ala-ya.


N'ihi ya si umu Israel, Mu onwem bu Jehova, M'gēme kwa ka unu si n'okpuru ibu nile nke ndi Ijipt pua, M'gānaputa kwa unu n'òfùfè-ha, were kwa ogwe-aka esetiri eseti, were kwa ikpé uku di iche iche, b͕aputa unu:


Nke nēme ka ogwe-aka-Ya mara nma je ije n'aka-nri Moses? Nke nēkewa miri n'iru ha, imere Onwe-ya aha ebighi-ebi?


na ihe-iriba-ama-Ya nile, na omume-Ya nile, nke Ọ mere Fero eze Ijipt, me kwa ala-ya nile, n'etiti Ijipt;


Jehova we were aka di ike, na ogwe-aka esetiri eseti, na egwu uku, na ihe-iriba-ama di iche iche, na ihe-ebube di iche iche, me ka ayi si n'Ijipt puta:


Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ nwawo ibà nime otù mba isi n'etiti ya were n'Onwe-ya mba ọzọ, n'ọnwunwa di iche iche, na n'ihe-iriba-ama di iche iche, na n'ihe-ebube di iche iche, na n'agha, na n'aka di ike, na n'ogwe-aka esetiri eseti, na n'oké egwu di iche iche, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-unu, mere unu n'Ijipt n'anya-unu?


ọnwunwa uku nile nke anya-gi huru, na ihe-iriba-ama nile, na ihe-ebube nile, na aka ahu di ike, na ogwe-aka ahu esetiri eseti, nke Jehova, bú Chineke-gi, ji me ka i puta: otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, gēme ndi ahu nile ndi gi onwe-gi nātu egwu ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan