Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 32:15 - Bible Nso

15 N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Agāzu kwa ulo na ubi na ubi-vine ọzọ n'ala nka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, a ga-emesịakwa zụọ ụlọ, ala ubi nakwa ubi vaịnị nʼala a.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 32:15
13 Iomraidhean Croise  

abum Onye nēme ka okwu orù-Ya guzosie ike, Nke nēmezu kwa ndum-ọdu ndi-ozi-Ya; Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēbi ya; Nke nēkwu kwa okwu bayere obodo nile nke Juda, si, Agēwu ha; nkpọnkpọ-ebe-ya nile ka M'gēwuli kwa:


Otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje ime ka ulo-ikwū nile nke Jekob adọtara n'agha lata, ọ bu kwa n'aru ebe-obidi-ya nile ka M'gēnwe obi-ebere; agēwu kwa obodo n'elu obo-ya, agēbi kwa n'ulo-elu-ya dika esiri ebi ya.


Ha gābia kwa, tie nkpu ọṅù n'ebe di elu nke Zaion, rùba dika osimiri rue ezi ihe Jehova, rue ọka, ru kwa manya-vine, ru kwa manu, ru kwa umu ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi: nkpuru-obi-ha gādi kwa ka ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma; ha agaghi-eru kwa újú ọzọ ma-ọli.


Juda na obodo-ya nile gēbikọ nime ya n'otù; ndi-ubi, na ndi nāchiri ìgwè aturu-ha bulie ije.


I gāku kwa ubi-vine ọzọ n'elu ugwu nile nke Sameria: ndi nāku vine gāku, me ka ha pua na nsọ anāsọ ha.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Chiri akwukwọ ndia, bú akwukwọ nzuta-ala nka, ma nke akara akàrà, ma akwukwọ a nke ghere oghe, tiye ha n'ite urọ; ka ha we digide ọtutu ubọchi.


Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi Jehova, asiwom, Were ego zutara onwe-gi ubi ahu, kpọ kwa ndi-àmà; ma enyewo obodo a n'aka ndi Kaldea.


si, Le, M'gaje ichikọputa ha n'ala nile, ebe M'chugaworo ha n'iwem, na n'ọnumam, na n'oké iwe di uku; M'gēme kwa ka ha lata n'ebe a, me kwa ka ha biri na ntukwasi-obi:


Ha gēbi n'elu ya na ntukwasi-obi; ha gēwu kwa ulo, kua ubi-vine, biri na ntukwasi-obi; mb͕e M'mesiri ihe nile ekpere n'ikpe n'aru ndi nile nēlelì ha n'ebe nile di ha buruburu; ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-ha Jehova.


N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ka unu gākpọbata, onye ọ bula ọ kpọbata madu-ibe-ya, n'okpuru osisi vine na n'okpuru osisi fig.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan