Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 31:6 - Bible Nso

6 N'ihi na otù ubọchi gādi mb͕e ndi-nche ndi nọ n'ugwu Efraim gākpọ, si, Bilienu, ka ayi rigorue Zaion jekuru Jehova, bú Chineke-ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha, ‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn, ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 31:6
23 Iomraidhean Croise  

Abaija we bilie n'elu ugwu Zemaraim, nke di n'ugwu Efraim, si, Nurunum, Jeroboam na Israel nile;


Ndi-isi ulo nke ndi bu nna Juda na Benjamin, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, bú onye ọ bula Chineke kpọtere mọ-ya, we bilie irigo iwu ulo Jehova nke di na Jerusalem.


Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke ike o nwere di na Gi; Uzọ nile atuliri atuli ijeru Zaion di ha n'obi.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agāfù opì-ike uku; ha gābia kwa, bú ndi nāla n'iyì n'ala Asiria, na ndi achusara achusa n'ala Ijipt; ha gākpọkwa isi ala nye Jehova n'ugwu nsọ ahu nime Jerusalem.


Rigo n'elu ugwu di elu, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Zaion; welie olu-gi n'ike, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Jerusalem; welie ya, atula egwu; si obodo nile nke Juda, Le, Chineke-unu!


N'elu mb͕idi-gi nile, Jerusalem, ka M'doworo ndi-nche; ogologo ubọchi nile ehihie na abali, mb͕e nile, ha agaghi-edebe ọnu-ha du: unu ndi nēchetara Jehova ihe, unu ederela du,


Latanu, umu nke nādaghachi azu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; n'ihi na Mu onwem bu di nwe unu: M'gēwere kwa unu, otù site n'otù obodo, abua site n'otù ab͕uru, M'gēme kwa ka unu biarue Zaion:


Ha gābia kwa, tie nkpu ọṅù n'ebe di elu nke Zaion, rùba dika osimiri rue ezi ihe Jehova, rue ọka, ru kwa manya-vine, ru kwa manu, ru kwa umu ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi: nkpuru-obi-ha gādi kwa ka ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma; ha agaghi-eru kwa újú ọzọ ma-ọli.


M'gēme kwa ka Israel lata n'ebe-ita-nri-ya, ọ gāta kwa nri na Kamel na Beshan, ọ bu kwa n'ugwu Efraim na nime Gilead ka afọ gēju nkpuru-obi-ya.


Eme-kwa-ram ka ndi-nche biliere unu, si, Ṅanu nti olu opì-ike; ha we si, Ayi agaghi-aṅa nti.


Nwa nke madu, Onye-nche ka M'doworo gi nye ulo Israel: i gānu kwa okwu site n'ọnum, dọ ha aka na nti site nam.


Nwa nke madu, gwa umu ndi-gi okwu, si ha, Ala ọ bula, mb͕e M'nēme ka mma-agha biakwasi ya, ma ndi ala ahu eweputawo otù onye n'etiti ha, me ya ka ọ ghọrọ ha onye-nche:


Agāchikọta kwa umu Juda na umu Israel, ha gēdo-kwa-ra onwe-ha otù onye-isi, si n'ala-ha rigopu, n'ihi na ihe uku ka ubọchi Jezreel bu.


Onye-nche ka Efraim bu n'aka Chinekem: ma onye-amuma, ib͕udu nke osi-ọnyà di n'uzọ-ya nile, ikpọ-asì di kwa n'ulo Chineke-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan