Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 31:31 - Bible Nso

31 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e Mu na ulo Israel na ulo Juda gāb͕a ọb͕ub͕a-ndu ọhu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 “Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 31:31
24 Iomraidhean Croise  

Ma Mu onwem, nka bu ọb͕ub͕a-ndum nke di n'etiti Mu na ha, ka Jehova siri: Mọm nke di n'aru gi, na okwum nile nke M'tiyeworo n'ọnu-gi, agaghi-apu n'ọnu-gi, na n'ọnu nkpuru-gi, na n'ọnu nkpuru nke nkpuru-gi, ka Jehova siri, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.


Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka Ihe-opupú nke nēme ezi omume biliere Devid, otù Eze gābu kwa eze, ọ gēnwe kwa uche, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume n'ala nka.


N'ihi na, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka ndim lata, bú Israel na Juda, ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka ha lata n'ala ahu nke M'nyere ndi bu nna-ha, ha gēnweta kwa ya.


Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gagha nkpuru madu na nkpuru anumanu n'ulo Israel na n'ulo Juda.


Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gaghi-esi n'iso ha ime ha nma laghachi azu; ma egwum ka M'gētiye n'obi-ha, ka ha we ghara isi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha.


Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo: ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka ọ gābu n'ebe ha nọ: M'gēdo kwa ha, me ka ha ba uba, M'gētiye kwa ebe nsọm n'etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi.


Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e onye-plough gēkwudo onye nēbì ọka, onye-nzọcha-nkpuru-vine gēkwudo kwa onye nāgha nkpuru-ọghigha; ugwu nile gēme ka manya-vine utọ nābusa, ugwu ntà nile gāb͕aze kwa.


n'ihi na nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusiri ọtutu madu ka ewe b͕aghara nmehie.


O we si ha, Nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusì n'ihi ọtutu madu.


Mb͕e ha risiri nri-anyasi Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram, bú nke anāwusi n'ihi unu.


Mb͕e ha risiri nri-anyasi, Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram: nēmenu nka, mb͕e ọ bula unu gāṅu ya, ka unu we nēchetam.


Onye me-kwa-ra ayi ka ayi rue ibu ndi nēje ozi ọb͕ub͕a-ndu ọhu; ọ bughi nke ihe edeworo n'akwukwọ, kama ọ bu nke Mọ Nsọ: n'ihi na ihe ahu edeworo n'akwukwọ nēb͕u eb͕u, ma Mọ ahu nēnye ndu.


Ka ha ra kwa, bú ndi gāgazi dika ihe-ọtùtù a si di, udo dikwasi ha, ya na ebere, dikwasi kwa Israel nke Chineke.


Ọ bughi kwa nání unu ka mu onwem nāb͕a ọb͕ub͕a-ndu a na iṅu-iyi a nye;


n'ihi na ayi onwe-ayi bu ndi obibì-úgwù, ndi ji Mọ nke Chineke nēkpe ekpere, ndi nānya kwa isi nime Kraist Jisus, ndi natukwasighi kwa obi n'anu-aru-ayi:


na Jisus, bú onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, na ọbara nke nfesa nke nēkwu nke-ọma kari nke ọbara Ebel kwuru.


Ma Chineke nke udo, Onye were ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ahu si na ndi nwuru anwu kughachi oké Onye-ọzùzù-aturu nke aturu-Ya, bú Onye- nwe-ayi Jisus,


N'ihi na ebe enyeworo ọnọdu ndi-nchu-àjà ahu, ọ di nkpà ka ọdida nke iwu puta kwa.


Ọ bu kwa n'ihi nka ka Ọ bu onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, ka ọ gābu, ebe otù Onye nwuru ib͕aputa madu n'aka njehie nile nke di n'okpuru ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu, ka ndi akpọworo we nata nkwa nke nketa ebighi-ebi ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan