Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 31:25 - Bible Nso

25 N'ihi na emewom ka afọ jubiga nkpuru-obi nāda #mbà ókè, ọ bu kwa nkpuru-obi ọ bula nke nēru újú ka M'juworo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Aga m enwoghakwa ike ndị na-ada mba, meekwa ka afọ ju ndị ike gwụrụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 31:25
14 Iomraidhean Croise  

N'ihi na O mewo ka afọ ju nkpuru-obi nāchọsi ihe ike, Ọ bu kwa nkpuru-obi agu nāgu ka O nyejuworo ezi ihe.


Ọ nēweghachi nkpuru-obim: Ọ nēdum n'uzọ nile nke ezi omume n'ihi aha-Ya.


Otù onye gādi kwa ka ebe izonari ifufe, na ebe-nzuzo ipu n'oké miri-ozuzo; dika ọtutu iyi juputara na miri n'ebe kpọrọ nku, dika ǹdò nke oké nkume di elu n'ala nke kpatara ike-ọgwugwu.


Ọ bu Onye nēnye onye dara #mbà ike; onye ike nādighi ka Ọ nēme kwa ka ọ nwe ume n'uba.


Ndi ewedara n'ala na umu-ob͕eye nāchọ miri ma ọ dighi nke dinu, ire-ha kpọsiri nku n'ihi akpiri kpọrọ nku; Mu onwem, bú Jehova, gāza ha, Mu, bú Chineke Israel, M'gaghi-arapu ha.


Onye-nwe-ayi, bú Jehova, enyewom ire nke ndi-nmuta, ka m'we mara iwere okwu kwagide onye dara #mbà: Ọ nākpọte ntim kwa-ututu, Ọ nākpọte ntim inu ihe dika ndi-nmuta.


Ha gābia kwa, tie nkpu ọṅù n'ebe di elu nke Zaion, rùba dika osimiri rue ezi ihe Jehova, rue ọka, ru kwa manya-vine, ru kwa manu, ru kwa umu ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi: nkpuru-obi-ha gādi kwa ka ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma; ha agaghi-eru kwa újú ọzọ ma-ọli.


M'gēme kwa ka afọ abuba jubiga nkpuru-obi ndi-nchu-àjà ókè, afọ ezi ihem gēju kwa ndim; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ezi ihe-ọzùzù-aturu ka M'gēji zù ha, ọ bu kwa n'ugwu nile nke ebe di elu nke Israel ka ebe-ita-nri-ha gādi: n'ebe ahu ka ha gāmakpu n'ezi ebe-ita-nri, ọ bu kwa ihe-ọzùzù-aturu makarisiri nma ka ha gēji zù onwe-ha n'ugwu nile nke Israel.


Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n'ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike.


Ngọzi nādiri ndi agu ezi omume nāgu, ndi akpiri nākpọ kwa nku na ya: n'ihi na ndi ahu ka afọ gēju.


O werewo ezi ihe nile nyeju ndi agu nāgu afọ; Zipu kwa ndi-ọgaranya n'aka efu.


ma onye ọ bula nke gāṅu miri ahu nke Mu onwem gēnye ya, akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi; kama miri ahu nke Mu onwem gēnye ya gāghọ nime ya isi-iyi miri nāsuputa ri nne rue ndu ebighi-ebi.


Otú ọ di, Onye ahu Nke nākasi ndi di ala obi, bú Chineke, were ọbibia Taitọs kasi ayi obi;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan