Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 31:23 - Bible Nso

23 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ha gēkwu kwa okwu a ọzọ n'ala Juda, na n'obodo-ya nile, mb͕e m'gēme ka ndi-ya adọtara n.agha lata, si: Jehova gọzie gi, gi ebe-obibi nke ezi omume, gi ugwu nke idi-nsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘Onyenwe anyị gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 31:23
23 Iomraidhean Croise  

Jehova gēsi na Zaion gọzie gi: Gi lekwasi kwa ọdi-nma Jerusalem anya ubọchi nile nke ndu-gi,


Ọzọ, ndi nāgabiga asighi, Ka ngọzi Jehova diri unu; Ayi agọziwo unu n'aha Jehova.


Ka Jehova si na Zaion gọzie gi, Bú Onye keworo elu-igwe na uwa.


Zọputa ndi-Gi, gozi kwa ihe-nketa-Gi: Nāzù kwa ha dika aturu, nēku kwa ha n'aka-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.


Ò si-kwa-ra aṅa ghọ nwanyi nākwa iko, bú obodo ahu kwesiri ntukwasi-obi? obodo ahu nke juputara n'ikpé ziri ezi! ezi omume nānọri ọnọdu-abali nime ya, ma ub͕u a ndi-ob͕u-madu.


M'gēme kwa ka ndi-ikpe-gi laghachi dika na mbu, M'gēme kwa ka ndi nādu gi ọdu laghachi dika na nmalite: emesia agākpọ gi Obodo ezi omume, obodo nke kwesiri ntukwasi-obi.


Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile: n'ihi na ihe-ọmuma Jehova gējuputa uwa, dika miri si ekpuchi oké osimiri.


Mb͕e ahu ikpé ziri ezi gēnwe ebe-obibi-ya n'ọzara, ezi omume gēbi kwa n'ubi ọma ahu.


Jehova di elu; n'ihi na O bi n'elu: O mejuwo Zaion n'ikpe ziri ezi na ezi omume.


Ndi-gi kwa, ha nile gābu ndi ezi omume, rue mb͕e ebighi-ebi ka ha gēnweta ala; alaka nke ọkukúm, ọlu akam, ime ka M'ma nma.


M'gēkwe kwa ka unu chọtam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēme kwa ka ndi-unu adọtara n'agha lata, M'gēsi kwa na mba nile, na n'ebe nile M'chugaworo unu, chikọta unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka unu lata n'ebe ahu nke M'mere ka unu si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ.


Otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje ime ka ulo-ikwū nile nke Jekob adọtara n'agha lata, ọ bu kwa n'aru ebe-obidi-ya nile ka M'gēnwe obi-ebere; agēwu kwa obodo n'elu obo-ya, agēbi kwa n'ulo-elu-ya dika esiri ebi ya.


Ubi ka agāzú nēgo, de kwa aha n'akwukwọ-ha, ka kwa ha akàrà, kpọ kwa ndi-àmà, n'ala Benjamin, na n'ebe nile di Jerusalem buruburu, na n'obodo nile nke Juda, na n'obodo nile nke ugwu, na n'obodo nile nke ebe di ala ala, na n'obodo nile nke Negeb: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ndi nile ndi nāchọputa ha eripiawo ha: ndi nākpab͕u ha siri, Ikpe amaghi ayi, n'ihi na ha emehiewo megide Jehova, bú ebe-obibi nke ezi omume, na olile-anya nke ndi bu nna-ha, bú Jehova.


Ma n'ugwu Zaion ka ufọdu ndi b͕apuru ab͕apu gādi, ọ gādi kwa nsọ; ulo Jekob gēnweta kwa ihe-nnweta nile ha.


Ọ gēru kwa, n'ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n'elu ugwu nile, agēbuli kwa ugwu ahu elu kari ugwu ntà nile; ndi di iche iche gērùbà nime ya dika osimiri.


Otú a ka Jehova siri: Alaghachiwom na Zaion, M'gēbi kwa n'etiti Jerusalem: agākpọ kwa Jerusalem Obodo ezi-okwu; agākpọ kwa ugwu nke Jehova nke usu nile ndi-agha Ugwu nsọ.


Ma, le, Boaz siri na Bet-lehem bia, si ndi n=eb#i ọka, Jehova nọyere unu. Ha we si ya, Jehova gọzie gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan