Jeremaya 31:16 - Bible Nso16 Otú a ka Jehova siri: Jide olu-gi ka ọ ghara ikwa ákwá, jide kwa anya-gi abua ka ha ghara ib͕a anya-miri: n'ihi na ugwọ-ọlu di agākwu gi n'ọlu-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ha gēsi kwa n'ala onye-iro lata. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 Ma otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa, jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri, nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa. Faic an caibideil |
agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'ihi na Jehova di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n'ulo Jehova. N'ihi na M'gēme ka ndi ala nka adọtara n'agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.