Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 31:15 - Bible Nso

15 Otú a ka Jehova siri: Olu nime Rema ka anuru, bú abù-ákwá, na ikwa-ákwá nēlu ilu nke-uku, Rechel nākwara umu-ya ákwá; ọ juwo na agaghi-akasi ya obi bayere umu-ya, n'ihi na ha adighi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “A nụrụ otu olu na Rema, iru ụjụ na oke ịkwa akwa. Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya, o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya, nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 31:15
18 Iomraidhean Croise  

Rechel we nwua, elìe ya n'uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem).


Umu-ya ndikom nile na umu-ya ndinyom nile we bilie ikasi ya obi; ma ọ juru, na agaghi-akasi ya obi; ọ si, N'ihi na m'gāridakuru nwam rue ala-mọ nēru újú. Nna-ya we kwara ya ákwá.


Ha si, Ayi onwe-ayi ndi-orù-gi bu umu-nne iri na abua, umu nke otù nwoke n'ala Kenean; ma, le, nke-ntà di n'aka nna-ayi ta, ma otù nke fọduru anọghi ndu.


Jekob nna-ha we si ha, Mu ka unu b͕abaworo aka umu: Josef anọghi ndu, Simeon anọghi kwa ndu, ọ bu kwa Benjamin ka unu gēkuru: mu ka ihe ndia nile biakwasiworo.


Inok na Chineke we yikọ nējeghari: ọ nọghi kwa: n'ihi na Chineke kuru ya la.


Ma gini mere I nādighi-ebupu njehiem, me ka ajọ omume gabiga? N'ihi na ub͕u a m'gēdina n'ájá: I gāchọsikwam ike, ma m'gaghi-anọ.


O we gabiga, ma, le, ọ nọgh: M'we chọ ya, ma achọtaghi ya.


N'ubọchi nkpab͕um Onye-nwe-ayi ka m'chọrọ: Akam setiri eseti n'abali, o sinwukwaghi; Nkpuru-obim juru ka akasie ya.


ha agabigawo uzọ-ngabiga; Geba bu ebe-inọ-ọnọdu-abali ayi gēnwe, ka ha kwuru: Rema nāma jijiji, Gibea nke Sọl ab͕alagawo.


N'ihi nka ka m'siri, Lepunum anya, m'gākwakpọ anya; unu adọgbula onwe-unu ikasim obi, n'ihi nbibi ada nke ndim.


Emebisiwo ulo-ikwūm, etibìsiwo kwa udọ̀m nile: umum esiwo n'ebe m'nọ pua, ha anọghi kwa: ọ dighi kwa onye nēseti ulo-ikwūm nākwuli kwa ákwà-nkwubam.


Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, zilagasiri ya site na Rema, ka o weresiri ya mb͕e ọ bu onye ejiri nkpọrọ ke ab͕u n'etiti ndi Jerusalem na Juda nile ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi emere ka ha je biri na Babilon.


Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu; Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha.


O we b͕asa ya n'irum; ma edere ya-ri ihe n'iru na azu: ma ihe edere ya-ri nime ya bu abù-ákwá di iche iche, na isu-udè, na ahuhu.


na Gibeon, na Rema, na Beirot;


Nwayi ahu bi kwa n'okpuru nkwu Debora n'etiti Rema na Bet-el n'ugwu Efraim: umu Israel we rigokute ya ka o kpe ha ikpe.


Nlata-ya bu na Rema, n'ihi na n'ebe ahu ka ulo-ya di; ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ kpere Israel ikpe: o we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan