Jeremaya 30:21 - Bible Nso21 Ọzọ, onye-ebube nke Jekob gābu onye sitere na ya, onye nāchi ya gēsi kwa n'etiti ya puta; M'gēme kwa ka ọ biarue nso, o we biakutem nso: n'ihi na ònye ka onye a bu nke nọworo obi-ya mbé ibiakutem nso? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a21 Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha; onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta. Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso, nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam, maka ịbịaru m nso?’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Faic an caibideil |
Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebeita-nri nādigide mb͕e nile: ma n'otù ntabi-anya ka M'gēme ka o si n'aru-ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara arọputa? onye-nlekọta-ya ka M'gēme ya: n'ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n'irum?
Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebe-ita-nri nādigide mb͕e nile: ma n'otù ntabi-anya ka M'gēme ka ha si n'aru ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara? onye-nlekọta-ya ka M'gēme ya: n'ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n'irum?