Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 30:18 - Bible Nso

18 Otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje ime ka ulo-ikwū nile nke Jekob adọtara n'agha lata, ọ bu kwa n'aru ebe-obidi-ya nile ka M'gēnwe obi-ebere; agēwu kwa obodo n'elu obo-ya, agēbi kwa n'ulo-elu-ya dika esiri ebi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu ya; aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya. A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya; ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 30:18
38 Iomraidhean Croise  

Devid, bú eze, we si nkpọkọta Israel nile, Solomon nwam, onye Chineke rọputaworo nání ya, bu nwata, ọ di kwa nrò, ma ije-ozi a di uku: n'ihi na ọ bughi madu ka ulo uku a diri, kama ọ bu Jehova, bú Chineke.


nye kwa Solomon nwam obi zuru okè, idebe ihe nile I nyere n'iwu, na ihe-àmà-Gi nile, na ukpuru-Gi nile, na ime ihe ndia nile, na iwu ulo uku ahu, nkem'doziworo ihe bayere ya.


Ma obodo ahu sara mbara n'aka abua, di kwa uku: ma ndi-ayi di ole-na-ole n'etiti ya, ulo adighi kwa nke ewuru ewu.


Gi onwe-gi gēbili, nwe obi-ebere n'aru Zaion: N'ihi na mb͕e eruwo imere ya amara, n'ihi na mb͕e akara àkà abiawo.


N'ihi na nkume-ya nile nātọ ndi-orù-Gi utọ, Ha nēme-kwa-ra ájá-ya amara.


Ka udo di n'ékpè-gi nile, Ka inọ-n'udo di kwa n'ulo-gi nile di elu.


Tukwasinu obi-unu n'ékpè-ya, Tulenu ulo nile ya di elu; Ka unu we kọrọ ọb͕ọ nēso n'azu.


Chineke Nke nọ n'ulo nile ya di elu emewo ka amara Ya na Ya bu ulo-elu.


O we wue ebe nsọ Ya dika ebe di elu, Dika uwa nke Ọ tọrọ ntọ-ala-ya rue mb͕e ebighi-ebi.


Jehova, ihe ala-Gi atọwo Gi utọ: I mewo ndi Jekob adọtara n'agha ka ha lata.


abum Onye nēme ka okwu orù-Ya guzosie ike, Nke nēmezu kwa ndum-ọdu ndi-ozi-Ya; Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēbi ya; Nke nēkwu kwa okwu bayere obodo nile nke Juda, si, Agēwu ha; nkpọnkpọ-ebe-ya nile ka M'gēwuli kwa:


Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Sairọs, si, Ọ bu onye-ọzùzù-aturum, ihe nile nke nātọm utọ ka ọ gēmezu kwa: ọbuná n'ikwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēwu ya; na n'isi ulo uku Chineke, Agātọ ntọ-ala-gi.


Mu onwem gāchikọta kwa ìgwè ewu na aturu nkem fọduru site n'ala nile ebe M'chusaworo ha, M'gēme kwa ka ha lata n'ebe-ita-nri-ha; ha gāmu kwa ọmùmù, ba uba.


N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.


M'gēkwe kwa ka unu chọtam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēme kwa ka ndi-unu adọtara n'agha lata, M'gēsi kwa na mba nile, na n'ebe nile M'chugaworo unu, chikọta unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka unu lata n'ebe ahu nke M'mere ka unu si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ.


N'ihi na, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka ndim lata, bú Israel na Juda, ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka ha lata n'ala ahu nke M'nyere ndi bu nna-ha, ha gēnweta kwa ya.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ha gēkwu kwa okwu a ọzọ n'ala Juda, na n'obodo-ya nile, mb͕e m'gēme ka ndi-ya adọtara n.agha lata, si: Jehova gọzie gi, gi ebe-obibi nke ezi omume, gi ugwu nke idi-nsọ.


Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agēwuru Jehova obodo a site n'ulo-elu nke Hananel rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku.


M'gēwu kwa gi ọzọ dika ulo, ewe wu gi, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú Israel: agēji kwa egwú-otiti-gi nile chọ gi nma ọzọ, i gēso kwa otite-egwú nke ndi nēgwuri egwú pua.


Ndagwurugwu ahu nile nke ozu, na nke ntu, na ọzara nile rue miri-iyi Kidron, rue nkuku ọnu-uzọ-ama inyinya n'akuku ọwuwa-anyanwu, gābu ihe nsọ Jehova nwere; agaghi-eropu ya, agaghi-etikpọ kwa ya ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Agāzu kwa ulo na ubi na ubi-vine ọzọ n'ala nka.


Ubi ka agāzú nēgo, de kwa aha n'akwukwọ-ha, ka kwa ha akàrà, kpọ kwa ndi-àmà, n'ala Benjamin, na n'ebe nile di Jerusalem buruburu, na n'obodo nile nke Juda, na n'obodo nile nke ugwu, na n'obodo nile nke ebe di ala ala, na n'obodo nile nke Negeb: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'ihi na Jehova di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n'ulo Jehova. N'ihi na M'gēme ka ndi ala nka adọtara n'agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'gēme kwa ka ndi Juda adọtara n'agha na ndi Israel adọtara n'agha lata, M'gēwu kwa ha dika ulo, dika na mbu.


Ma gi onwe-gi, atula egwu, gi orùm, bú Jekob, atu-kwa-la ujọ, gi Israel: n'ihi na, le, M'gaje izọputa gi n'ebe di anya, zọputa kwa nkpuru-gi n'ala ọzọ ebe emere ka ha je biri; Jekob gālata kwa, nọ jū n'aru mgbū, ọ dighi kwa onye ganēme ka ọ ma jijiji.


Ma o gēru, n'ikpe-azu nke ubọchi nile, na M'gēme ka ndi Ilam adọtara n'agha laghachi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma emesia M'gēme ka umu Amon adọtara n'agha laghachi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'gēme kwa ka madu na anumanu ba uba n'elu unu; ha gāba kwa uba, mua ọmùmù: M'gēme kwa ka madu bi nime unu dika ọnọdu mb͕e ochie unu si di, M'gēme kwa unu nma karia na mb͕e mbu unu: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


M'gēme kwa ka ndim adọtara n'agha, bú Israel, lata, ha gēwu kwa obodo nile tọb͕ọrọ n'efu, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ṅua manya-ha; ha gēme kwa ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha.


Mọ-ozi nke Jehova we za, si, Jehova nke usu nile ndi-agha, rùe ole mb͕e ka Gi onwe-gi nāgaghi-emere Jerusalem na obodo Juda nile ebere, bú nke I wesaworo oké iwe ọgu arọ atọ na iri ndia?


N'ihi nka ka Jehova siri otú a: Ejiwom obi-ebere nile laghachikute Jerusalem; agēwu ulom nime ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), agēseti kwa eriri-ọtùtù n'elu Jerusalem.


N'ubọchi ahu ka M'gēme ka ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda di ka ihe igu ọku n'etiti nkú, na dika ọwa nēnwu ọku n'etiti ùkwù-ọka; ha gēripia kwa ndi nile di iche iche di ha buruburu n'aka-nri na n'aka-ekpe: Jerusalem gēbi kwa ọzọ n'onodu-ya, obuná nime Jerusalem.


Jehova gēbu kwa uzọ zọputa ulo-ikwū nile nke Juda, ka ima-nma nke ulo Devid na ima-nma nke ndi bi na Jerusalem we ghara idi uku n'elu Juda.


Ala nka nile gāghọ ihe di ka Araba, site na Geba rue Rimon na Ndida Jerusalem: agēbuli kwa ya elu, ọ gēbi kwa n'ọnọdu-ya, site n'ọnu-uzọ-ama Benjamim rue ebe ọnu-uzọ-ama mbu, rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, site kwa n'ulo-elu Hananel rue ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile nke eze.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan