Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 30:16 - Bible Nso

16 N'ihi nka agēripia ndi nile nēripia gi; ọzọ, ndi nile ndi nākpab͕u gi, ha nile, na ndọta-n'agha ka ha gāla; ndi nāpunara gi ihe gāghọ ihe apunaraworo n'aka madu, ọ bu kwa ndi nile nke nāluta ihe-gi n'agha ka M'gēnye ka ha ghọ ihe-nluta-n'agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 “ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị; ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ. Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike. Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 30:16
44 Iomraidhean Croise  

Ka ihere me ha, ka ha laghachi kwa azu, Bú ndi nile nākpọ Zaion asì.


N'ihi na, ma ọ buru na i ge nti n'olu-ya n'ezie, we me ihe nile nke M'nēkwu, M'gābu-kwa-ra ndi-iro-gi onye-iro, kpab͕u kwa ndi nākpab͕u gi.


N'ihi na Jehova gēkpe ọnu-ha, We punara ndi ahu ndu, bú ndi nāpunara ha ihe.


Ndi nile di iche iche gēkuru kwa ha, me ka ha biarue ọnọdu-ha: ulo Israel gēketa kwa ha n'ala Jehova ibu ndi-orù na ibu ndinyom nēje ozi: ha gāghọ kwa ndi nādọta ndi nādọta ha-ri n'agha n'agha; ha gēnwe kwa ike n'aru ndi nāchi ha-ri n'ihe-ike.


Ahuhu gādiri gi onye nāpunara madu ihe, ma gi onwe-gi bu onye anāpunaraghi ihe; onye nāghọb͕u kwa aghọb͕u, ma ha aghọb͕ughi gi! mb͕e i napubìri madu ihe, agāpunara gi ihe; mb͕e i ghọb͕ubìri, ha gāghọb͕u gi.


Le, ọ buru na onye ọ bula akpalie ise-okwu megide gi, o siteghi na Mu: onye ọ bula nke kpaliworo ise-okwu n'ebe i nọ gāda ada n'ihi gi.


Ọ dighi ihe-agha ọ bula akpuworo imegide gi gāga nke-ọma: ọzọ, ire ọ bula nke gēbili imegide gi n'ikpé ka i gāma ikpe. Nka bu ihe-nketa nke ndi-orù Jehova, ezi omume-ha nēsite nam: ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Wukwasi mba nile ọzọ ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi, wukwasi kwa ab͕uru nile ndi nākpọkughi aha-Gi: n'ihi na ha eripiawo Jekob, e, ha eripiawo ya, me ka ọ gwusia, ha emewo kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.


Otú a ka Jehova kwuru megide ndi-ab͕ata-obi ọjọm nile, ndi nēmetu ihe-nketa ahu aka nke M'meworo ka ndim, bú Israel, keta: le, M'gaje iropu ha n'elu ala-ha, ulo Juda ka M'gēropu kwa n'etiti ha.


Israel bu ihe nsọ Jehova nwere, nkpuru mbu nke ihe-ọmume-Ya: ikpe gāma ndi nile nke nēripia ya; ihe ọjọ gābiakwasi ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


O gēru kwa, mb͕e ọgu arọ na iri ruzuru, na M'gēwere ajọ omume ha leta eze Babilon, leta kwa mba ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), leta kwa ala Kaldea; M'gēme kwa ya ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi.


Gini mere i ji ti nkpu bayere nb͕aji aka na ukwu gi? ihe nādighi ngwọta ka ihe-nb͕u-gi bu: n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, n'ihi na nmehie-gi nile nwere ume, ka M'meworo gi ihe ndia.


Ge nti olu ndi nāb͕alaga, ndi nāb͕apu n'ala Babilon, igosi ibọ̀-ọ́bọ̀ nke Jehova, bú Chineke-ayi, na Zaion, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.


Site na Dan ka anuru ima-imi nke inyinya-ya nile: site n'olu ọbube nile nke inyinya-ya nile di ike ala nka nile amawo jijiji; ha we bia richapu ala na ùjú-ya; obodo na ndi bi nime ya.


Ha anuwo na onye nēze ume ka m'bu; ọ dighi onye-nkasi-obi m'nwere; Ndi-irom nile anuwo ihe ọjọm; obi atọwo ha utọ na Gi onwe-gi emewo ya: I gēme ka ọ bia, bú ubọchi I kpọsaworo, ha ewe di ka mu onwem.


Ka ihe ọjọ nile ha bia n'iru Gi; Gi me kwa ha, dika I meworom n'ihi njehiem nile: N'ihi na ize-umem di ọtutu, aru adighi kwa obim ike.


Ndi nile bi n'Ijipt gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, n'ihi na ha aburuworo ulo Israel nkpa-n'aka nke bu nání amì.


N'ihi na i nwere iro ebighi-ebi, we rara umu Israel nye n'aka mma-agha na mb͕e nhuju-anya-ha, na mb͕e nke ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu:


M'gēre kwa umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom nye n'aka umu Juda, ha ewe re ha nye ndi Sheba, bú mba di anya: n'ihi na Jehova ekwuwo.


Ma ub͕u a ọtutu mba achikọtawo onwe-ha imegide gi, ndi nāsi, Ka emerua ya, ka anya-ayi lekwasi kwa Zaion.


Nwanyi-irom gāhu kwa ya, ihere ewe kpuchie ya iru; bú onye nāsim, Òle ebe Jehova, bú Chineke-gi, nọ? Anyam abua gēlekwasi ya; ub͕u a ka ọ gāghọ ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí.


Ma Ọ gēji miri nke nērubiga ókè nke nērubiga erubiga me ka ọnọdu obodo ahu gwusia, ọ bu kwa ndi-iro-Ya ka Ọ gāchubà n'ọchichiri.


Afọ ihere ejuwo i kari nsọpuru: ṅua, ọbuná gi onwe-gi, ghọ onye anēbìghi úgwù: iko aka-nri Jehova gēchighari rue gi aru, ihere nke jọb͕uru onwe-ya gādi kwa n'elu ebube-gi.


Anuwom ita-uta Moab, na nkwulu nile nke umu Amon, nke ha jiworo ta ndim uta, me onwe-ha uku megide ókè-ala-ha.


Mọ-ozi nke nāgwam okwu we sim, Kpọsa, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ekwoworom Jerusalem na Zaion oké ekworo.


Ọ bu kwa iwe uku ka Mu onwem nēwesa mba nile ndi nọ jū: n'ihi na Mu onwem were iwe nke-ntà, ma ha onwe-ha yere aka ime ha ihe ọjọ.


Le, Mu onwem gaje ime Jerusalem ka ọ ghọrọ ndi nile di iche iche ndi di ya buruburu ọkwa nṅaghari, ọ bu kwa n'aru Juda ka ọ gādi nime nnọchigide-n'agha ahu agānọchigide Jerusalem.


M'gāchikọta kwa mba nile ibuso Jerusalem agha; agēwere kwa obodo a, punara ya ulo-ya nile, merua ndinyom-ya: nkera obodo a gāpu buru ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ma agaghi-ebipu ndi nka fọduru n'obodo a.


Jehova gēketa kwa Juda n'òkè-Ya n'elu ala nsọ a, rọputa kwa Jerusalem ọzọ.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ bu mb͕e nsọpuru gasiri ka O ziworom jekuru mba nile ndi nākwata unu: n'ihi na onye nēmetu unu aka nēmetu nwa-anya-Ya.


Jehova, bú Chineke-gi, gētiyekwasi ọb͕ub͕a-iyi ndia nile n'isi ndi-iro-gi, na n'isi ndi nākpọ gi asì, ndi churu gi.


Ọ buru na ọ diri onye ọ bula ka adọta ya n'agha, ọ bu n'agha ka agādọta ya: ọ buru na onye ọ bula gēji mma-agha b͕u madu, aghaghi iji mma-agha b͕u ya. Nebe a ka ntachi-obi na okwukwe nke ndi nsọ di.


Umu Israel we si n'ichusi ndi Filistia ike lata, ha we kwakọrọ ọmuma-ulo-ikwū nile ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan