Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 3:9 - Bible Nso

9 O rue, site n'idi-nfe nke ikwa-iko-ya, na emeruru ala-ya, ọ we kwaso nkume, kwaso kwa osisi, iko.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ma nke a emeghị ka ihere mee ya. O merụọla ala, ọ na-akwakwa iko site nʼife nkume na osisi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 3:9
16 Iomraidhean Croise  

Ma unu onwe-unu, biaruenu nso ebe a, unu umu-ndikom nke nwanyi ji igwe-oji atu isi ọma na isi ọjọ, unu nkpuru nke nwoke nākwa iko na nwanyi nākwa iko.


N'etiti nkume kwọrọ murumuru nke miri-iyi ka òkè-gi di; ha onwe-ha, ha onwe-ha bu ihe ruru gi n'ife-nzà: ọ bu kwa ha ka i wusiworo àjà-ihe-ọṅuṅu nye, sure kwa àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma. Àgākasim obi bayere ihe ndia?


Ma ha nile n'otù bu anu-ọhia na ndi-nzuzu: idọ-aka-na-nti nke ihe-efu, nání osisi ka ọ bu.


Ma M'gēburu uzọ kwughachi ajọ omume-ha na nmehie-ha okpukpu abua; n'ihi na ha emewo alam ka ọ ghara idi nsọ n'ozu nke nile ha nke nāsọ oyi, ọ bu kwa ihe-árú nile ha ka ha ji kpojue ihe-nketam.


ndi nāsi osisi, Nnam ka i bu; nāsi kwa nkume, Gi onwe-gi murum: n'ihi na ha ab͕akutawom azu, ha echeghm iru: ma na mb͕e ọnọdu ọjọ ha ha gasi, Bilie, we zọputa ayi.


M'we me ka unu bata n'ala nke ubi ọma, iri nkpuru-ya na ezi ihe-ya: unu we bata, we merua alam, me ka ihe-nketam ghọ ihe-árú.


Welie anya-gi abua le ebe nile di elu nke ọhia nādighi, hu; òle ebe gi na ndikom nēdinakọtaghi? N'uzọ nile ka i nọworo nēle anya ha, dika onye Arebia n'ọzara; i we were ikwa-iko-gi nile, were kwa ihe ọjọ gi, merua ala.


I we chiri ihe-gi nile mara nma nke sitere n'ọla-edom na n'ọla-ọcham, nke M'nyere gi, i we mere onwe-gi onyinyo di iche iche nke nwoke, kwaso ha iko,


Ndi ahu kpughere ọtọ-ya: umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom ka ha chiri, ma ya onwe-ya ka ha jiri mma-agha b͕ue: o we ghọrọ ndinyom aha iji dọ ha aka na nti; ọ bu kwa ihe nile ekpere n'ikpe ka ha mere n'aru ya.


I we leta ajọ ihe-nzube nke mb͕e i di na nwata, n'ipi ọnu-ọnu ara-gi abua nke ndi Ijipt piri n'ihi ara abua nke i nwere mb͕e i di na nwata.


ha we kwa iko n'Ijipt; ọ bu mb͕e ha di na nwata ka ha kwara iko: n'ebe ahu ka abiagidere ara-ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ha piri ọnu-ọnu ara-ha aka, bú nke ha nwere mb͕e ha di nāmaghi nwoke.


Unu na nne-unu kpe ikpe, kpenu; n'ihi na ya onwe-ya abughi nwunyem, Mu onwem abughi kwa di-ya: ya wezuga ikwa-iko-ya nile n'iru ya, ya wezuga kwa ikwa-iko nile nke nwanyi nwere di ọ nākwa n'etiti ara-ya abua;


Ndim nāju ase n'aka osisi-ha, nkpa-n'aka-ha nēgosi kwa ha ihe: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile emewo ka ha kpafue, ha we pua n'okpuru Chineke-ha kwa iko.


Ọ bu Gi, Jehova, ka m'nākpọku: n'ihi na ọku erichapuwo ebe-ita-nri nile nke ọzara, ire-ọku esuyewo kwa ọku n'osisi nile nke ọhia.


Ahuhu diri onye nāsi osisi, Teta; nke nāsi nkume dara ob͕i, Kpọte onwe-gi! Nka, ò gēzí ihe? Le, ihe a bu ihe eji ọla-edo na ọla-ọcha machita, ọ dighi kwa mọ ọ bula di nime ya.


ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nārapu nwunye-ya, ma-ọbughi n'ihi ikwa-iko, ọ nēme nwanyi ahu ka ọ nọ n'ọnọdu onye akwara iko megide: onye ọ bula nke gālu kwa ya mb͕e arapusiri ya, ọ nākwa iko.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan