Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 3:8 - Bible Nso

8 M'we hu na, mb͕e M'chupusiri Israel, nye ya akwukwọ nkewa-ya n'ihi ihe ndia nile, bú na Israel nke nādaghachi azu kwarari iko, na nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u aghọb͕u, Juda atughi egwu; ọ we je kwa iko, ọbuná ya onwe-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Enyere m Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi akwụkwọ alụkwaghị m, chụpụ ya nʼihi ndụ ịkwa iko ya, ma lee na nwanne ya nwanyị onye na-ekwesịkwaghị ntụkwasị obi bụ Juda atụghị egwu. Ọ gakwara nʼihu ịkwa iko.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 3:8
20 Iomraidhean Croise  

Onye ahu me-kwa-ra ebe di elu n'ugwu nile nke Juda, we me ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, ọ rafu-kwa-ra Juda.


Otú a ka Jehova siri, Òle ebe akwukwọ nkwa nke nne-unu di, bú nke M'ji chupu ya? ma-ọbu ònye nime ndi M'nara ego n'ọmuru-nwa ka M'reworo unu n'aka ya? Le, ọ bu n'ihi ajọ omume nile nke unu ka erere unu, ọ bu kwa n'ihi njehie nile nke unu ka achupuru nne-unu.


Ihe ọjọ gi gādọ gi aka na nti, ndaghachi-azu-gi nile gāba-kwa-ra gi nba: ya mere mara, hu na ihe ọjọ na ihe di ilu ka ọ bu, na i rapuworo Jehova, bú Chineke-gi, oké egwum we ghara idi n'aru gi, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ọ si, Le, ọ buru na nwoke achupu nwunye-ya, nwayi ahu ewe si n'ebe ọ nọ la, we ghọ nwunye nke nwoke ọzọ, di mbu ya, ọ̀ gālu kwa ya ọzọ? àgaghi-emeru ala ahu emeru nke-uku? Ma gi onwe-gi akwawo iko, gi na ọtutu ndi-iko: ì si na i gālaghachikutem? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ì hughi ihe ndi nka kwuworo, si, Ab͕uru abua nke Jehova rọputara, Ọ juworo ha? ọ bu kwa ndim ka ha nēlelì anya, ha we ghara ibu kwa mba n'iru ha ọzọ.


M'gēsi kwa aṅa b͕aghara gi? umu-gi arapuwom, we were ihe nābughi chi ṅu iyi: mb͕e M'mere ka ha rijue afọ, ha we kwa iko, ọ kwa n'ulo nwanyi nākwa iko ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe.


Nwa-nne-gi nwanyi nke-okenye bu Sameria, nke bi n'aka-ekpe-gi, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom: nwa-nne-gi nwanyi nke-ntà, nke bi n'aka-nri-gi, bu Sọdọm na umu-ya ndinyom.


Ma ọ bughi n'uzọ di iche iche ha ka i jeworo ije, ọ bughi kwa dika ihe-árú nile ha si di ka i meworo; kama, dika agāsi na nke ahu bu nọ̄ ihe ntà, i we bibie onwe-gi kari ha n'uzọ-gi nile.


Sameria kwa, ọ bughi ka nkera nke nmehie-gi nile ra ka o meworo; i we me ka ihe-árú-gi ba uba kari nke ha, i we gua umu-nne-gi ndinyom na ndi ezi omume site n'ihe-árú-gi nile nke i meworo.


Ha we bakuru ya, dika madu si abakuru nwanyi nākwa iko: otú a ka ha bakuru Ohola, bakuru kwa Oholiba, bú ndinyom ahu nēzube ajọ ihe.


N'ihi nka ka M'nyere ya n'aka ndi nāhu ya n'anya, n'aka umu Asiria, ndi agu ha guru ya.


N'ihi na ọtutu ubọchi ka umu Israel gānọdu nēnweghi eze, nēnweghi kwa onye-isi, nēnweghi kwa àjà, nēnweghi kwa ogidi, nēnweghi kwa ephod na teraphim:


Mb͕e nwoke gāluru nwunye, we buru di-ya, ọ gēru kwa, ọ buru na nwayi ahu ahutaghi amara n'iru ya, n'ihi na ọ huwo ihe nēkwesighi ekwesi n'aru ya, na ọ gēdere ya akwukwọ nkewa, we nye ya n'aka, we zipu ya n'ulo-ya.


Ma asi na nwoke nke-ikpe-azu ahu akpọ ya asì, de-kwa-ra ya akwukwọ nkewa, we nye ya n'aka, we zipu ya n'ulo-ya; ma-ọbu mb͕e nwoke nke-ikpe-azu ahu gānwu, bú nke lutara ya n'onwe-ya na nwunye;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan