Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 3:5 - Bible Nso

5 Ọ̀ gēchebe iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi? Ọ̀ gēdebe ya rue ọgwugwu ihe nile? Le, i kwuwo otú a, i we me ihe ọjọ gi nile, we nwe ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Iwe gị ọ ga-adịgide mgbe niile? Iwe gị dị ọkụ ọ ga-adịgide ebighị ebi?’ Otu a ka unu si ekwu okwu, ma unu nọgidesịrị ike na-eme ihe ọjọọ niile unu nwere ike ime.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 3:5
14 Iomraidhean Croise  

Ub͕u a ọ di n'obim ka ayi na Jehova, bú Chineke Israel, b͕a ndu, ka iwe-Ya nke di ọku we si n'ebe ayi nọ chigharia.


Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I ganēwesa ayi iwe? Ì gēme ka iwe-Gi digide rue ọb͕ọ nile?


Gì onwe-gi agaghi-eme ka ayi di kwa ndu ọzọ: Ka ndi-Gi we ṅuria nime Gi?


N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gānalu ọ̀gù, ọ bughi kwa rue mb͕e nile ka M'ganēwe iwe: n'ihi na mọ gāda #mbà n'irum, ya na nkpuru-obi nile Mu onwem meworo.


Jehova, ewela iwe nke-uku, echeta-kwa-la ajọ omume rue mb͕e ebighi-ebi: le, biko, legide anya, ndi-Gi ka ayi nile bu.


Je, kpọsa okwu ndia n'uzọ Ugwu, si, Lata, gi Israel nke nādaghachi azu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; M'gaghi-edo unu iru iwe: n'ihi na onye-ebere ka M'bu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gaghi-edebe iwe rue mb͕e ebighi-ebi.


Gini mere ndi nka nke Jerusalem ji adaghachi azu na ndaghachi-azu ebighi-ebi? ha ejidesiwo aghughọ ike, ha ajuwo ilọta.


Aṅaram nti we nu, ihe nēzighi ezi ka ha nēkwu: ọ dighi onye ọ bula chèghariworo uche n'ihe ọjọ ya, si, Gini ka m'meworo? onye ọ bula echighariwo ba n'ọb͕ub͕a-ọsọ-ya, dika inyinya nke nāb͕abiga ọsọ ókè n'agha.


Le, ndi-isi Israel, onye ọ bula ka ogwe-aka-ya ra, anọwo nime gi iwusi ọbara.


Ahuhu diri ndi nēchèputa ajọ ihe, nālu kwa ihe ọjọ n'elu ihe-ndina-ha! n'ìhè nke ututu ka ha nēme ya, n'ihi na ọ di n'ike aka-ha.


Ọ bu n'elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n'ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n'iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan