Jeremaya 3:1 - Bible Nso1 Ọ si, Le, ọ buru na nwoke achupu nwunye-ya, nwayi ahu ewe si n'ebe ọ nọ la, we ghọ nwunye nke nwoke ọzọ, di mbu ya, ọ̀ gālu kwa ya ọzọ? àgaghi-emeru ala ahu emeru nke-uku? Ma gi onwe-gi akwawo iko, gi na ọtutu ndi-iko: ì si na i gālaghachikutem? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a1 “Ọ bụrụ na nwoke agbaara nwunye ya alụkwaghị m, nwanyị ahụ ahapụ ya pụọ ga lụrụ nwoke ọzọ, di mbụ ya ahụ, o kwesiri ịlaghachi ka ọ lụọkwa ya ọzọ? Ọ bụ na agaghị emerụ ala ahụ nke ukwuu? Ma unu ebiela ndụ dịka ndị akwụna nwere ọtụtụ ndị iko, ọ bụ ugbu a ka unu ga-alaghachikwute m?” otu ka Onyenwe anyị kwupụtara. Faic an caibideil |