Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 29:7 - Bible Nso

7 Chọ-kwa-nu udo nke obodo ahu nke M'meworo ka eme ka unu je biri n'ebe ahu, kpe-kwa-ranu Jehova ekpere bayere ya: n'ihi na n'udo-ya ka udo gādiri unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Chọọnụ udo nke obodo ahụ m mere ka unu gaa biri nʼime ya. Kpeekwanụ ekpere nye Onyenwe anyị banyere ya. Nʼihi na ọ bụrụ na ihe agaara obodo ahụ nke ọma, ọ ga-agakwara unu nke ọma.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 29:7
12 Iomraidhean Croise  

ka ha we nēweta nso ihe ísì utọ nye Chineke nke elu-igwe, nēkpe kwa ekpere bayere ndu eze, na nke umu-ya ndikom.


Ihe ọ bula nke putara n'iwu Chineke nke elu-igwe, ka eme ya n'uzọ ziri ezi nye ulo Chineke nke elu-igwe; n'ihi na, n'ìhi gini ka iwe gādi megide ala-eze nke eze na umu-ya ndikom?


Riọnu aririọ bayere udo Jerusalem: Ndi nāhu gi n'anya gānọ n'udo.


Ndi-isi we si eze, Biko, ka eme ka nwoke a nwua; n'ihi na ya onwe-ya nēme ka aka ndi-agha kuda, bú ndi fọduru n'obodo a, na aka ndi Israel nile, n'igwa ha okwu dika okwu ndia: n'ihi na nwoke a adighi-achọrọ ndi nka udo, kama ọ bu ihe ọjọ.


n'ihi nka si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ebe M'meworo ka ha je n'ebe di anya n'etiti mba nile, ebe M'chusawo-kwa-ra ha n'ala nile, M'gāghọ-kwa-ra ha ebe nsọ nwa mb͕e ntà n'ala nile ebe ha bàworo.


Mb͕e ahu o juru Daniel, onye aha-ya bu Belteshaza, anya nwa mb͕e, èchìchè-ya nile we me ka ọ ma jijiji. Eze zara, si, Belteshaza, ekwela ka nrọ a ma-ọbu akukọ-isi-ya me ka i ma jijiji. Belteshaza zara, si, Onye-nwem, ka nrọ a diri ndi nākpọ gi asì, ka akukọ-isi-ya di-kwa-ra ndi-iro-gi.


N'ihi nka, eze, kwe ka ndum-ọdum di gi nma n'anya, were kwa ezi omume tijipu nmehie-gi nile, were kwa imere ndi ewedara n'ala amara tijipu ajọ omume-gi nile; asi na ogologo mb͕e gādiri udo-gi.


Ka nkpuru-obi ọ bula do onwe-ya n'okpuru ndi nāchi isi n'elu ya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nāchi isi ma ọ buru na Chineke edoghi ya; ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo.


N'ihi ya ọ di nkpà ido onwe-unu n'okpuru ya, ọ bughi nání n'ihi iwe ahu, kama ọ bu kwa n'ihi akọ-na-uche.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan