Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 29:32 - Bible Nso

32 N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iji nmehie Shemaia onye-Nehelamait leta ya, leta kwa nkpuru-ya; ọ gaghi-enwe nwoke ọ bula nēbi n'etiti ndi nka, ọ gaghi-elekwasi kwa ezi ihe ahu anya, bú nke Mu onwem nēmere ndim, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na okwu nwezuga ka o kwuworo megide Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m aghaghị ịta Shemaya onye Nehelam na mkpụrụ ya ahụhụ nʼihi mmehie ya. Ọ gaghị enwe nwoke ọbụla ga-afọdụ ndụ nʼetiti ndị ya niile. Ọ gaghị esokwa unu lekwasị anya nʼihe ọma ahụ niile m na-akwado imere ndị m, nʼihi na o kwusara nnupu isi megide Onyenwe anyị. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 29:32
24 Iomraidhean Croise  

Ọ si ya, Mu onwem bu kwa onye-amuma dika gi; mọ-ozi we gwam okwu n'okwu Jehova, si, Me ka o soro gi lata n'ulo-gi, ka o we rie nri ṅu kwa miri. Ma ọ gwara ya okwu-ugha.


Ekpenta Neaman gārapara kwa n'aru gi, na n'aru nkpuru-gi rue mb͕e ebighi-ebi. Ọ we si n'iru ya pua, buru onye-ekpenta nēnwu dika snow.


Ọchi-agha ahu onye eze nwere, onye ọ nādabere n'aka-ya, we za onye nke Chineke, si, Le, ọ buru na Jehova eme window n'elu-igwe, ihe a, ọ̀ gādi? Ọ si, Le, i ganēwere anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-eri nime ya.


gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;


Gi na ha agaghi-abu otù n'olìlì, n'ihi na ala-gi ka i bibiworo, ndi-gi ka i b͕uworo; nkpuru nke ndi nēme ihe ọjọ, agaghi-akpọ aha-ha rue mb͕e ebighi-ebi.


M'gēbili kwa megide ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēbipu kwa na Babilon aha na ndi fọduru, na umu na umu umu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ọ gādi kwa ka osisi tamarisk n'ala ihe nādighi, ọ gaghi-ahu kwa mb͕e ọdi-nma nābia; ma ọ gēbi n'ebe nile kpọrọ nku n'ọzara, bú ala nnú ebe madu nēbighi.


Gi onwe-gi kwa, Pashua, na ndi nile bi n'ulo-gi gēje na ndọta-n'agha: ọ bu kwa Babilon ka i gābata, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka agēlì gi, gi onwe-gi, na ndi nile nāhu gi n'anya, ndi i buworo amuma ugha.


Otú a ka Jehova siri, Denu nwoke a n'akwukwọ na ọ bu onye b͕a aka nwa, bú nwoke nke ihe nāgaghi-agara nke-ọma n'ubọchi-ya nile: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nime nkpuru-ya ihe gāgara nke-ọma, nke ganānọkwasi n'oche-eze Devid, nāchi kwa achi ọzọ na Juda.


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje isi n'elu uwa zilaga gi: n'arọ a ka gi onwe-gi gānwu, n'ihi na okwu nwezuga ka i kwuworo megide Jehova.


Ọzọ, okwu bayere Shemaia, bú onye-Nehelamait, ka i gēkwu, si,


Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,


n'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Agaghi-ebipu n'ulo Jonadab nwa Rikab onye nwe iguzo n'irum ubọchi nile.


M'gēji kwa ajọ omume-ha leta ya, leta kwa nkpuru-ya, leta kwa ndi-orù-ya; M'gēme kwa ka ihe ọjọ ahu nile nke M'gwara ha, ma ha anughi, biakwasi ha, biakwasi kwa ndi bi na Jerusalem, biakwasi kwa ndi Juda.


M'gāsachapu kwa ndi nānupu isi na ndi nējehie megidem n'etiti unu; n'ala ebe ha nọ dika ọbìa ka M'gēme ka ha si puta, ma ọ bughi n'ala Israel ka ha gābà: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


n'ihi nka ka Jehova siri otú a: Nwunye-gi ganākwa iko n'obodo, umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom gāda kwa site na mma-agha, agēji kwa eriri kèsa ala-gi; gi onwe-gi gānwu kwa n'ala ruru árú, aghaghi ime kwa ka Israel si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.


Site na mma-agha ka ndi-nmehie nile nke ndim gānwu, ndi nāsi, Ihe ọjọ ahu agaghi-erute ayi aru, ọ gaghi-abia kwa n'iru ayi n'akuku ọ bula.


Ma agēme ka onye-amuma ahu, ma-ọbu ọrọ-nrọ ahu, nwua; n'ihi na o kwuworo okwu nwezuga megide Jehova, bú Chineke-unu, (Onye nēme ka unu si n'ala Ijipt puta, Onye nāb͕aputa kwa gi n'ulo ndi-orù), ka o we duhie gi n'uzọ ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n'iwu ije ije nime ya. I we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan