Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 29:26 - Bible Nso

26 Jehova emewo gi onye-nchu-àjà n'ọnọdu Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, ka ndi-nlekọta we di n'ulo Jehova, imeso onye ọ bula nāwi ara, nke nēme kwa onwe-ya onye-amuma, ka i we tiye ya n'ọtọsi na nime nkpọrọ olu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 ‘Onyenwe anyị ahọpụtala gị mee gị onye nchụaja ga-anọchi anya Jehoiada. Nʼihi ya, ị bụrụla onyeisi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ya mere, o kwesiri ka i jide onye ara ọbụla na-akpọ onwe ya onye amụma, manye ya agbụ igwe nʼụkwụ, na nʼolu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 29:26
28 Iomraidhean Croise  

Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we nye ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise iwu, bú ndi-nlekọta usu-ndi-agha, si ha, Menu ka ọ pua ba n'etiti akuku; ma onye nābiaso ya n'azu, werenu mma-agha me ka ọ nwua: n'ihi na onye-nchu-àjà siri, Ka aghara ime ka ọ nwua n'ulo Jehova.


Ndi nile nke ala ahu we ba n'ulo Beal, kwatue ya; ebe-ichu-àjà-ya nile na onyinyo-ya nile, ha tupiara ha nke-ọma, ha b͕u-kwa-ra Matan, bú onye-nchu-àjà Beal, n'iru ebe-ichu-àjà ahu. Onye-nchu-àjà we do ndi-nkekọta ilekọta ulo Jehova.


Jehu we pukute ndi-orù onye-nwe-ya: otù onye we si ya, Ùdo di kwa? gini mere onye a nke nāwi ara biakutere gi? Ọ si ha, Unu onwe-unu amawo nwoke ahu na nkpari-uka-ya.


Esa we wesa onye-ọhu-uzọ ahu iwe, tiye ya n'ulo ọtọsi; n'ihi na o nēkosa ya ọnuma n'ihi ihe a. Esa we zọpia ufọdu nime ndi-ya na mb͕e ahu.


unu gāsi kwa, Otú a ka eze siri, Tiyenu onye a n'ulo-nkpọrọ, me ka o rie nri nmeb͕u, ṅu kwa miri nmeb͕u, rue mb͕e m'gālaghachi n'udo.


Ma ub͕u a, n'ìhi gini ka i nābasighi Jeremaia onye Anatot nba ike, onye nēme onwe-ya onye-amuma n'ebe unu nọ,


Jeremaia we nọgide n'ogige ulo-nche rue ubọchi ewere Jerusalem. O rue, mb͕e ewere Jerusalem,


Ha we were Jeremaia, tubà ya n'olùlù Malkija nwa eze, nke di n'ogige ulo-nche: ha we chiri udọ̀ rada Jeremaia. Ma miri adighi n'olùlù ahu, ọ bu nání apiti: Jeremaia we mibe n'apiti ahu.


Ubọchi nile nke nleta abiawo, ubọchi nkwughachi abiawo; Israel gāma ya: onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka onye-amuma bu, onye-ara ka onye nwere Mọ Chineke bu, n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, na n'ihi na ihe bara uba ka ikpọ-asì ahu bu.


N'ubọchi ahu isi-iyi gādi nke ghere oghe nye ulo Devid, nye kwa ndi bi na Jerusalem, bayere nmehie baye-kwa-ra ọrurú.


Mb͕e Ọ batara n'ulo uku Chineke, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju we biakute Ya mb͕e O nēzí ihe, si, Ọ̀ bu n'aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ònye nye-kwa-ra Gi ike a?


Mb͕e ndi-ikwu-Ya nuru ya, ha we pua ijide Ya: n'ihi na ha nāsi, Anya adighi Ya nma.


Ọtutu nime ha we si, O nwere mọ ọjọ, anya adighi kwa Ya nma; gini mere unu nānu olu-Ya?


Ndi-Ju zara Ya, si, Ọ bughi n'ihi ọlu ọma ka ayi nātu Gi nkume, kama ọ bu n'ihi nkwulu; n'ihi kwa na Gi onwe-gi, ebe I bu madu, I nēme Onwe-gi Chineke.


Ọ̀ gābu na Gi onwe-gi ka nna-ayi Abraham uku, onye nwuru anwu? ndi-amuma nwu-kwa-ra: ònye ka I nēme Onwe-gi?


onye, ebe enyere ya-ri iwu di otú a, ọ tubàra ha nime ulo-nkpọrọ di nime, kpọsie ha ọtọsi ike n'ukwu.


Esite-kwa-ram n'ime ka ha hu ahuhu-nmehie ọtutu mb͕e n'ulo-nzukọ nile chọ uzọ ime ka ha kwulu Chineke; ebe anya nādighm nma gabiga ókè megide ha, m'we nēsob͕u ha we rue obodo di iche eche di n'azu ala-ayi.


Mb͕e ọ nāgọpu onwe-ya otú a, Festọs were oké olu si, Pọl, anya adighi gi nma; oké nmuta-akwukwọ-gi nēme gi ka i ghọ onye anya nādighi nma.


Ma Pọl siri, Abughm onye anya nādighi nma, Festọs onye di oké ebube; anamekwuwa okwu nke ezi-okwu na nke anya-udo.


Ma mb͕e ha nāgwa ndi-Ju okwu, ndi-nchu-àjà na ọchi-agha nke ulo uku Chineke na ndi-Sadusi biakwasiri ha,


ha we tukwasi aka-ha n'aru ndi-ozi, tubà ha n'ulo-nkpọrọ ọra madu.


Ma mb͕e ọchi-agha nke ulo Chineke na ndi-isi-nchu-àjà nuru okwu ndia, ha nwere obi abua nke-uku bayere ha ebe nka gērusi.


site kwa na window ka esi na mb͕idi radam n'ihe akpara akpa, m'we b͕apu n'aka-ya.


Atula ahuhu nile i gaje ihu egwu: le, ekwensu gaje itubà ufọdu n'etiti unu nime ulo-nkpọrọ, ka ewe nwa unu; unu gēnwe kwa nkpab͕u ubọchi iri. Gosi onwe-gi onye kwesiri ntukwasi-obi rue ọnwu, M'gēnye kwa gi okpu-eze ahu, bú ndu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan