Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 29:25 - Bible Nso

25 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, N'ihi na gi onwe-gi ezigaworo ndi nka nile ndi bi na Jerusalem, ziga-kwa-ra Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà nile, akwukwọ n'aha-gi, si,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “I dere akwụkwọ zigara ndị niile bi na Jerusalem, ha na Zefanaya nwa Maaseia onye nchụaja, na ndị nchụaja ndị ọzọ. Ị gwara Zefanaya okwu nʼakwụkwọ ahụ sị ya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 29:25
16 Iomraidhean Croise  

Hezekaia we nata akwukwọ n'aka ndi-ozi ahu, gua ha: Hezekaia we rigorue ulo Jehova, b͕asa ya n'iru Jehova.


O we nu ihe bayere Tiahaka, bú eze Etiopia, si, Le, ọ putawo ibuso gi agha: o we zìe ndi-ozi jekuru Hezekaia ọzọ, si,


Ọ de-kwa-ra akwukwọ, ita Jehova, bú Chineke Israel, uta, na ikwu okwu megide Ya, si, Dika chi mba nile nke ala ọzọ nile, ndi nānaputaghi ndi-ha n'akam, otú a Chineke Hezekaia agaghi-anaputa ndi-ya n'akam.


Ọzọ, na mb͕e ahu ndi Juda amara aha-ha nēzigara Tobaia ọtutu akwukwọ-ozi, akwukwọ-ozi nke Tobaia nābiaru kwa ha aka.


Ha nēkwu kwa okwu bayere ezi omume-ya nile n'irum, ha nēburu kwa okwum nile pukuru ya. Akwukwọ-ozi ka Tobaia ziri ime ka m'tua egwu.


Sanbalat we ziterem onye nējere ya ozi nke ub͕ò ise dika okwu a si di, ya na akwukwọ-ozi nke emegheworo n'aka-ya;


Ma ndia bu okwu nke akwukwọ ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, si na Jerusalem zigara ndi-okenye fọduru nime ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, nke o ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-amuma, ziga-kwa-ra ndi Israel nile, ndi Nebukadneza mere ka ha si na Jerusalem je biri na Babilon:


Zefanaia, bú onye-nchu-àjà, we gua akwukwọ a na nti Jeremaia, bú onye-amuma.


Zedekaia, bú eze, we zìe Jehukal nwa Shelemaia, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, jekuru Jereamia, bú onye-amuma, si, Biko, kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere.


Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ:


riọ akwukwọ-ozi n'aka-ya igaru Damaskọs inye ndi ulo-nzukọ, ka ọ gābu, ma asi na ọ chọtara ndi ọ bula di n'Uzọ a, ma-ọbu ndikom ma-ọbu ndinyom, ka o we dọkpuru ha n'ab͕u bia Jerusalem.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan