Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 29:21 - Bible Nso

21 Okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere Ehab nwa Kolaia, baye-kwa-ra Zedekaia nwa Maaseia, ndi nēburu unu amuma ugha n'aham, si: Le, M'gaje inye ha n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon; o gētib͕u kwa ha n'anya-unu;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-ekwu banyere Ehab nwa Kolaya, na Zedekaya nwa Maaseia, ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m, “Aga m ewere ha nyefee nʼaka Nebukadneza bụ eze Babilọn. Ọ ga-etigbukwa ha nʼihu unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 29:21
8 Iomraidhean Croise  

N'ihi na otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje ime gi ka i ghọrọ onwe-gi, ghọ-kwa-ra ndi nile nāhu gi n'anya, ihe-ujọ: ha gāda kwa site na mma-agha ndi-iro-ha, anya-gi abua ganāhu kwa ya: ọ bu kwa Juda nile ka M'gēnye n'aka eze Babilon, ọ gēme kwa ka ha je biri na Babilon, ọ gēji kwa mma-agha tib͕ue ha.


Gi onwe-gi kwa, Pashua, na ndi nile bi n'ulo-gi gēje na ndọta-n'agha: ọ bu kwa Babilon ka i gābata, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka agēlì gi, gi onwe-gi, na ndi nile nāhu gi n'anya, ndi i buworo amuma ugha.


Ọzọ, n'aru ndi-amuma Jerusalem ka M'huworo ihe jọb͕uru onwe-ya; ha nākwa iko, nējeghari kwa n'okwu-ugha, ha emewo kwa ka aka ndi nēme ihe ọjọ di ike, ha we ghara isi, onye ọ bula n'ihe ọjọ ya, lata: ha nile aghọworom ihe di ka Sọdọm, ndi bi nime ya aghọwo-kwa-ram ihe di ka Gọmọra.


N'ihi na unu asiwo, Jehova emewo ka ndi-amuma biliere ayi nime Babilon.


Ndi-amuma-gi ahutaworo gi ọhù ihe-efu na ihe-nzuzu; Ma ha ekpugheghi ajọ omume-gi, ime ka ndi-gi adọtara n'agha lata: Kama ha ahutaworo gi ibu di iche iche nke ihe-efu na ihe-nchupu di iche iche.


Ma ndi-amuma ugha putakwara ìhè n'etiti ndi Israel, dika ndi-ozizí ugha gādi kwa n'etiti unu, bú madu ndi gēwere nzuzo webata irọ-òtù di iche iche nke ila-n'iyì, nāgọnari ọbuná Onye-nwe-ha Onye b͕ara ha, ndi nēweta ila-n'iyì di ngwa tukwasi onwe-ha n'isi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan