Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 29:2 - Bible Nso

2 (mb͕e Jekonaia, bú eze, na eze-nwanyi, na ndi-onozi, na ndi-isi Juda na Jerusalem, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, pusiri na Jerusalem;)

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Nke a bụ mgbe eze Jehoiakin, nne eze, ndị ozi nʼụlọeze, ndị ndu Juda na Jerusalem, ndị ọka, na ndị ụzụ sitere na Jerusalem dọta ha nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 29:2
13 Iomraidhean Croise  

Ufọdu kwa nime umu-gi ndikom, ndi gēsi n'aru-gi puta, ndi i gāmuta, ha gāchiri ha; ha gābu kwa ndi-onozi n'ulo uku eze Babilon.


Jihu we welie iru-ya le anya na window, si, Ònye diyerem? ònye? Onozi abua ma-ọbu atọ we leputa anya n'ebe ọ nọ.


Si eze, si kwa eze-nwayi, Menu onwe-unu ka unu di ala, nọdunu ala: n'ihi na ihe-isi nile nke unu adapuwo, bú okpu-eze nke ima-nma-unu.


Jehova we me ka m'hu, ma, le, nkata fig abua adọbara n'iru ulo uku nke Jehova; mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, mesiri ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi-isi Juda, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, si na Jerusalem je biri n'ala ọzọ, we me ka ha biarue Babilon.


nke Nebukadneza, bú eze Babilon, nāchighi, mb͕e o mere ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, si na Jerusalem je biri na Babilon, ya na ndi Juda na Jerusalem nile amara aha-ha;


ọzọ, Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi Juda nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi bàworo na Babilon, ndia ka Mu onwem gaje ime ka ha lata n'ebe a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na M'gab͕aji yoke nke eze Babilon.


Ma unu onwe-unu, nurunu okwu Jehova, unu ndi nile emere ka unu je biri n'ala ọzọ, ndi M'zigara si na Jerusalem rue Babilon.


Ebed-melek, bú onye Etiopia, onye bu onozi, nke nọ n'ulo eze, we nuru na ha tiyereri Jeremaia n'olùlù; ma eze nānọdu n'ọnu-uzọ-ama Benjamin;


Ma achọtaghi uzú ọ bula n'ala nile nke Israel: n'ihi na ndi Filistia siri, Ka ndi-Hibru we ghara ikpu mma-agha ma-ọbu ube:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan