O we kpere Ya; O we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, we nuru aririọ-amara-ya, me ka ọ lata na Jerusalem ba n'ala-eze-ya. Manase we mara na Jehova, Ya onwe-ya, bu Chineke.
ọ buru kwa na ha ewere obi-ha nile, were kwa nkpuru-obi-ha nile, laghachikute Gi n'ala ndọta-n'agha-ha, bú ebe ha dọtara ha n'agha, we kpe ekpere n'uzọ ala-ha, nke I nyere ndi bu nna-ha, na obodo ahu nke I rọputaworo, na n'ebe ulo nke m'wuworo aha-Gi di:
N'ihi na otù ndi gēbi na Zaion nime Jerusalem: i gaghi-akwa ákwá ọzọ ma-ọli: Ọ gēmere gi amara n'ezie n'olu iti-nkpu-gi; mb͕e Ọ nuru Ọ gāza gi otù mb͕e ahu.
N'ikwa-ákwá ka ha gābia, ọ bu kwa n'aririọ-amara nile ka M'gēduru ha: M'gēme ka ha jerue iyi di iche iche juputara na miri, n'uzọ ziri ezi, nke ha nāgaghi-asu ngọngọ nime ya: n'ihi na aghọworom Israel nna, ma Efraim, ọkparam ka ọ bu.
N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), umu Israel gābia, ha onwe-ha na umu Juda n'otù; ha ganēje ije nākwa ákwá, ọ bu kwa Jehova, bú Chineke-ha, ka ha gāchọ.
Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọzọ, nka ka M'gēkwe ka ulo Israel juam ase bayere ya, ka M'we mere ha ya; M'gēme ka ha ba uba na madu dika ìgwè ewu na aturu.
Ònye bu onye-amam-ihe? ọ gāghọta kwa ihe ndia; ònye bu onye-nghọta? ọ gāma kwa ha. N'ihi na uzọ nile nke Jehova ziri ezi, ndi ezi omume gēje kwa ije nime ha; ma ndi-njehie gāsu ngọngọ nime ha.
M'gēme kwa ka uzọ nke-atọ ba n'ọku, M'gānucha kwa ha dika esi anucha ọla-ọcha, nwa ha dika esi anwa ọla-edo: ndi ahu gākpọku aham, Mu onwem gāza kwa ha: M'gāsi, Ndi nkem ka ọ bu; ndi ahu gāsi kwa, Jehova bu Chinekem.