Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 28:16 - Bible Nso

16 N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje isi n'elu uwa zilaga gi: n'arọ a ka gi onwe-gi gānwu, n'ihi na okwu nwezuga ka i kwuworo megide Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Nʼihi nke a, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ekpebiela m isite nʼụwa wepụ gị. Ị ga-anwụ nʼafọ a, nʼihi na i kwusaala nnupu isi megide Onyenwe anyị.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 28:16
16 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ọ fọduru ubọchi asa, Mu onwem gaje ime ka miri zosa n'uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali; M'gēkpochapu kwa n'elu ala ihe nile ọ bula di ndu nke M'meworo.


Ihe a we ghọrọ ulo Jeroboam nmehie, ọbuná izopu ya, na ikpochapu ya n'elu uwa.


N'ìhi gini ka ndi Ijipt ganēkwu, si, Ọ bu ime ha ihe ọjọ ka O mere ka ha pua, ib͕u ha n'ugwu, na ime ka ha si n'elu uwa gwusia? Si n'idi-ọku nke iwe-Gi chigharia, chegharia n'ihe ọjọ a I nēchè imegide ndi-Gi.


Gi onwe-gi kwa, Pashua, na ndi nile bi n'ulo-gi gēje na ndọta-n'agha: ọ bu kwa Babilon ka i gābata, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka agēlì gi, gi onwe-gi, na ndi nile nāhu gi n'anya, ndi i buworo amuma ugha.


Hananaia, bú onye-amuma, we nwua n'arọ ahu n'ọnwa nke-asa.


Tutu ogologo arọ abua eruzue Mu onwem ganēbulata nēbe a ihe nile nke ulo Jehova, nke Nebukadneza, bú eze Babilon, siri n'ebe a bupu, we bubà ha na Babilon:


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iji nmehie Shemaia onye-Nehelamait leta ya, leta kwa nkpuru-ya; ọ gaghi-enwe nwoke ọ bula nēbi n'etiti ndi nka, ọ gaghi-elekwasi kwa ezi ihe ahu anya, bú nke Mu onwem nēmere ndim, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na okwu nwezuga ka o kwuworo megide Jehova.


n'ihi nka ka Jehova siri otú a: Nwunye-gi ganākwa iko n'obodo, umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom gāda kwa site na mma-agha, agēji kwa eriri kèsa ala-gi; gi onwe-gi gānwu kwa n'ala ruru árú, aghaghi ime kwa ka Israel si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.


Le, anya abua nke Onye-nwe-ayi Jehova di n'aru ala-eze a nke juputara na nmehie, M'gēkpochapu kwa ya n'elu uwa; nání na M'gaghi-ekpochapusi ulo Jekob; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


ọbuná ndikom ahu, bú ndi nēme ka akukọ ọjọ bayere ala ahu puta, nwuru n'ihe-otiti ahu n'iru Jehova.


N'ubọchi nke-asa kwa oke-ehi asa, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè:


n'ihi na Chineke ekworo ka Jehova, bú Chineke-gi, bu n'etiti gi; ka iwe Jehova, bú Chineke-gi, we ghara idi ọku megide gi, O we kpochapu gi n'elu ala.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan