Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 27:22 - Bible Nso

22 na Babilon ka agēbubà ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ha gādi, rue ubọchi M'gēleta ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); mb͕e ahu ka M'gēbugota ha, bulata n'ebe a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 ‘A ga-eburu ha niile bulaa ha Babilọn. Ebe ahụ ka ha ga-anọkwa tutu ruo mgbe m ga-abịa leta ha,’ ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘Mgbe ahụ, aga m ebulatakwa ha, kpọghachitekwa ha nʼebe a.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 27:22
24 Iomraidhean Croise  

Ma ogidi ọla nile nke di n'ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n'ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha je Babilon.


imezu okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia, rue mb͕e ubọchi-izu-ike-ya nile tọsiri ala ahu utọ: ubọchi nile nke ntọb͕ọrọ-n'efu-ya ọ kwusiri ọlu, imezu ọgu arọ atọ na iri.


Ihe nile nke ọla-edo na nke ọla-ọcha di nnù iri-na-atọ na ọgu iri. Ha nile ka, Sheshbaza chigotara, mb͕e ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ siri na Babilon rigorue Jerusalem.


Ihe nile kwa nke anēnye gi iji fè òfùfè nke ulo Chineke-gi, gi me ha ka ha zue okè n'iru Chineke Jerusalem.


N'ihi na n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu, nke ahu bu ntọ-ala nke nrigo ahu site na Babilon, ma ọ bu n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-ise ka ọ biaruru Jerusalem, dika ezi aka Chineke-ya si di n'aru ya.


Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.


M'gēnye kwa ihe nile akpakọbara n'obodo a, na ihe nile putara na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na ihe-ya nile nke di oké ọnu-ahia, e, àkù nile nke ndi-eze Juda ka M'gēnye n'aka ndi-iro-ha, ndi gāluta ihe-ha n'agha, chiri ha, chibà ha na Babilon.


e, okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Irael, kwuru bayere ihe nile fọduru n'ulo Jehova na n'ulo eze Juda, na nime Jerusalem, si:


Mba nile gēfè kwa ya na nwa-ya na nwa nwa-ya òfùfè rue mb͕e mb͕e ala-ya biara: mb͕e ahu ya onwe-ya ka ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ọ fè ha òfùfè.


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Mb͕e ọgu arọ atọ na iri ruzuru nye Babilon, M'gēleta unu, me ka ezi okwum ahu guzosiere unu ike, n'ime ka unu lata n'ebe a.


ọ bu kwa Babilon ka ọ gēme ka Zedekaia jerue, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ gānọ rue mb͕e M'gēleta ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): mb͕e unu gēbuso ndi Kaldea agha, ọ gaghi-agara unu nke-ọma?


Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Je, gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu, si ya, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje inye obodo a n'aka eze Babilon, ọ gēsure kwa ya n'ọku:


ma gi onwe-gi aghaghi-iwepuga onwe-gi n'aka-ya, kama aghaghi iwere gi, ọ bu kwa n'aka-ya ka agēnye gi; anya-gi abua gāhu kwa anya abua nke eze Babilon, unu gēkwurita kwa ọnu na ọnu, ọ bu kwa Babilon ka i gābà.


n'udo ka i gānwu; ọzọ, nsure nile nke nna-gi-hà, bú ndi-eze mbu, ndi buru gi uzọ, otú a ka ha gēsurere gi ihe; ọzọ, Éwù, onye-nwe-ayi! ka ha gāsi n'itiri gi aka n'obi; n'ihi na okwu ka Mu onwem kwuworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh:


n'arọ mbu nke ọbubu-eze-ya ka mu onwem, bú Daniel, jiri akwukwọ nile ayi ghọta ọnu-ọgugu arọ ahu, nke okwu Jehova ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere ha, imezuru nkpọnkpọ ebe nile nke Jerusalem, bú ọgu arọ atọ na iri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan