Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 27:21 - Bible Nso

21 e, okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Irael, kwuru bayere ihe nile fọduru n'ulo Jehova na n'ulo eze Juda, na nime Jerusalem, si:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru banyere ihe niile fọdụrụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda na nʼime Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 27:21
9 Iomraidhean Croise  

Le, ubọchi nābia, na ihe nile di n'ulo-gi, na nke nna-gi-hà debeworo n'ulo-àkù rue ta, agēburu ha je Babilon: ọ dighi ihe gāfọdu, ka Jehova siri.


Ihe nile nke ulo Chineke, ihe uku na ihe ntà, na àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke eze na ndi-isi-ya; ihe ndia nile ka ọ chibatara na Babilon.


Ihe nile nke ọla-edo na nke ọla-ọcha di nnù iri-na-atọ na ọgu iri. Ha nile ka, Sheshbaza chigotara, mb͕e ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ siri na Babilon rigorue Jerusalem.


Eze, bú Sairọs, chiputa-kwa-ra ihe ulo Jehova, nke Nebukadneza chipuru na Jerusalem tiye n'ulo ndi-chi-ya:


Le, ubọchi nābia, na ihe nile di n'ulo-gi, na nke nna-gi-hà debeworo n'ulo-àkù rue ta, agēburu ha je Babilon: ọ dighi ihe gāfọdu, ka Jehova siri.


M'gēnye kwa ihe nile akpakọbara n'obodo a, na ihe nile putara na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na ihe-ya nile nke di oké ọnu-ahia, e, àkù nile nke ndi-eze Juda ka M'gēnye n'aka ndi-iro-ha, ndi gāluta ihe-ha n'agha, chiri ha, chibà ha na Babilon.


nke Nebukadneza, bú eze Babilon, nāchighi, mb͕e o mere ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, si na Jerusalem je biri na Babilon, ya na ndi Juda na Jerusalem nile amara aha-ha;


na Babilon ka agēbubà ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ha gādi, rue ubọchi M'gēleta ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); mb͕e ahu ka M'gēbugota ha, bulata n'ebe a.


Onye-nkpab͕u ab͕asawo aka-ya n'elu ihe-utọ nile nke Jerusalem: N'ihi na ọ huwo na mba di iche iche abatawo n'ebe nsọ ya, Bú ndi I nyere iwu bayere ha na ha agaghi-abà nime nkpọkọta I nwere.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan